MALAKAI 2:13-15
MALAKAI 2:13-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja ONYENWE ANYị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha. Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị. Ọ bụ na ọ bụghị otu Chineke ahụ kere gị? Nʼanụ ahụ na nʼime mmụọ, unu bụ nke ya. Ma gịnị ka otu Chineke a chọrọ? Ka unu bụrụ ụmụ na-atụ ya egwu. Ya mere, jie mmụọ gị aka, ka ị gharakwa ịbụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼebe nwunye ị lụtara nʼokorobịa nọ.
MALAKAI 2:13-15 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bu kwa nka nke mere ya abua ka unu nēme: unu ji anya-miri na ikwa-ákwá na isu-udè ekpuchi ebe-ichu-àjà Jehova, O we ghara iche kwa onyinye-inata-iru-ọma ọzọ, ọ tọghi kwa Ya utọ inara ya n'aka-unu. Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi. Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.