MALAKAI 2:13-14
MALAKAI 2:13-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ihe ọzọ unu na-emekwa bụ ndị a: unu na-eme ka anya mmiri unu jupụta nʼebe ịchụ aja ONYENWE ANYị. Unu na-akwa akwa, na-eti mkpu akwa nʼihi na ọ naghị elenye anya nʼonyinye unu, maọbụ jiri obi ụtọ nabata ha. Unu na-asị “Nke a ọ bụ nʼihi gịnị?” Ọ bụ nʼihi na ONYENWE ANYị bụ onyeama nʼetiti gị na nwunye ị lụrụ nʼokorobịa gị, nʼihi na ị kwesighị ntụkwasị obi, ọ bụ ezie na ọ bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, bụrụkwa nwunye ọgbụgba ndụ gị.
MALAKAI 2:13-14 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bu kwa nka nke mere ya abua ka unu nēme: unu ji anya-miri na ikwa-ákwá na isu-udè ekpuchi ebe-ichu-àjà Jehova, O we ghara iche kwa onyinye-inata-iru-ọma ọzọ, ọ tọghi kwa Ya utọ inara ya n'aka-unu. Ma unu asiwo, N'ìhi gini? N'ihi na Jehova aburuwo onye-àmà n'etiti gi na nwunye i lutara n'okorọbia, onye gi onwe-gi ghọḅuworo, ọ bu ezie na ya onwe-ya bu nwan yi ejikọtara gi na ya, na nwunye ọḅuḅa-ndu-gi.