Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 9:49-62

LUK 9:49-62 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Jọn a zaa sị, “Nna anyị ukwu, anyị hụrụ otu onye ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị anyị, anyị gbochiri ya.” Jisọs sịrị ya, “Unu egbochila ya. Nʼihi na onye ọbụla na-adịghị emegide unu dịnyeere unu.” Mgbe oge o ji alaghachi na-abịaru nso, o chere ihu ya ịga Jerusalem. O zipụrụ ndị ozi, ka ha buru ya ụzọ gawa. Ka ha na-aga ha batara nʼotu obodo nta nke ndị Sameria ịkwado ihe niile tupu ọ bịa; ma ha jụrụ ịnabata ya nʼihi na o chere ihu ịga Jerusalem. Mgbe Jemis na Jọn ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, ha sịrị ya, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nʼeluigwe bịa laa ha nʼiyi?” Ọ tụgharịrị bara ha mba. Ma ha pụrụ banye nʼobodo nta ọzọ. Mgbe ha nọ na-aga ije a, otu nwoke sịrị ya, “Aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.” Jisọs zara, sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nke igwe nwekwara akwụ, ma Nwa nke Mmadụ enweghị ebe ọ na-atụkwasị isi.” Ọ gwara onye ọzọ sị, “Soro m.” Ma ọ sịrị ya. Onyenwe anyị, “Biko, nye m ohere ka m gaa buru ụzọ lie nna m.” Ma ọ sịrị ya, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha. Ma gị gaa kwusaa alaeze nke Chineke.” Ma onye ọzọkwa, sịrị ya, “Aga m eso gị, Onyenwe m, ma kwere ka m buru ụzọ gaa sị ndị ezinaụlọ m nọdụnụ nke ọma.” Jisọs sịrị ya, “Onye ọbụla jidere aka nʼọgụ anụ ụlọ na-adọkpụ ma na-ele anya nʼazụ ekwesighị alaeze Chineke.”

LUK 9:49-62 Bible Nso (IGBOB)

Jọn we za, si, Nna-ayi, ayi huru otù onye ka ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ n'aha-Gi; ayi we b͕ochie ya, n'ihi na ọ dighi-eso ayi. Ma Jisus siri ya, Unu eb͕ochila ya: n'ihi na onye nādighi-emegide unu diri unu. O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n'elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem, O we zipu ndi-ozi n'iru Ya: ha we ga, ba n'otù obodo ntà nke ndi Sameria, ka ha doziere Ya. Ma ha anaraghi Ya nke-ọma, n'ihi na iru-Ya di ka Ọ nāga Jerusalem. Ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya, bú Jemes na Jọn, huru nka, ha si, Onye-nwe-ayi, Ì nāchọ ka ayi si ọku site n'elu-igwe da, rechapu ha? O we chigharia, bara ha nba, si, Unu amataghi aha mọ di nime unu. N'ihi na Nwa nke madu abiaghi ila ndu madu n'iyì, kama ka o we zọputa ha. Ha we pua ga n'obodo ntà ọzọ. Mb͕e ha nāga n'uzọ, otù onye we si Ya, M'gēso Gi ebe ọ bula Ì nēje. Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya. O we si onye ọzọ, Som. Ma ọ siri, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam. Ma Ọ siri ya, Rapu ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu; ma gi onwe-gi je zisa ozi ala-eze Chineke. Onye ọzọ we si kwa, M'gēso Gi, Onye-nwe-ayi; ma kwe ka m'buru uzọ kele ndi nọ n'ulom ekele ikpe-azu. Ma Jisus siri ya, Ọ dighi onye ọ bula nke nēle anya n'azu, mb͕e o tiyesiri aka-ya n'ọ́gù anu-ulo nādọkpughari, kwesiri ala-eze Chineke.