LUK 8:40-42
LUK 8:40-42 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e Jisus laghachiri, ìgwè madu ahu nara Ya nke-ọma; n'ihi na ha nile nēle anya Ya. Ma le, otù nwoke, aha-ya bu Jeairọs, biara, ya onwe-ya bu kwa onye-isi ulo-nzukọ: o we da n'ala n'ukwu Jisus, we riọ Ya ka Ọ bia n'ulo-ya; n'ihi na o nwere nwa-nwanyi ọ muru nání ya, nke b͕ara ihe ra ka arọ iri na abua, nwata ahu nānwu kwa anwu. Ma mb͕e Ọ nēje ìgwè madu nile nākpab͕u Ya.
Kesaa
Gụọ LUK 8LUK 8:40-42 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Jisọs lọghachiri, igwe mmadụ nabatara ya nʼihi na ha niile na-eche ya. Mgbe ahụ otu nwoke nke aha ya bụ Jairọs, onye bụ onyeisi nʼụlọ ekpere, bịara daa nʼala nʼụkwụ Jisọs na-arịọ ya ka ọ bịa nʼụlọ ya. Nʼihi na otu nwata nwanyị ọ mụtara naanị ya, nke gbara afọ iri na abụọ nọ nʼọnụ ọnwụ. Mgbe ọ na-aga, igwe mmadụ ahụ na-akpagbu ya.
Kesaa
Gụọ LUK 8