LUK 8:4-18
LUK 8:4-18 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e oké ìgwè madu nēzukọ, mb͕e ndi si n'obodo nile nābiakute kwa Ya, O we kwue okwu site n'ilu: Ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru-ya: mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ; ewe zọkwasi ha ukwu, anu-ufe nke elu-igwe we tuturie ha. Nkpuru ọzọ we da n'elu oké nkume; mb͕e ha puru ome, ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi ala miri. Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu; ogwu ahu we so ha pue, kpab͕ue ha. Nkpuru ọzọ we da n'ezi ala, ha we pue, we mia nkpuru ọgu ise ọgu ise. Mb͕e O nēkwu okwu ndia, O tie nkpu, si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu. Ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ihe ilu a gābu. O we si, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze Chineke: ma ndi fọduru ka anāgwa okwu n'ilu; ka ha ghara ihu n'ọhuhu, ghara kwa inuta n'ọnunu. Ma ilu ahu bu nka: Nkpuru ahu bu okwu Chineke. Ndi nọ n'akuku uzọ ahu bu ndi nuru; mb͕e ahu ekwensu bia, we napu okwu ahu n'obi-ha, ka ha ghara ikwere, ewe zọputa ha. Ndi nọ kwa n'oké nkume ahu bu ndi were ọṅù nara okwu ahu mb͕e ọ bula ha nuru ya; ma ndia enweghi nkpọrọgwu, ndi kwere na nwa oge, ma n'oge ọnwunwa ha wezuga onwe-ha. Nkpuru nke dara n'etiti ogwu ahu, ndia bu ndi nuru, ma mb͕e ha nāga n'uzọ-ha ncheb͕u na àkù na ihe-utọ nke ndu anākpab͕u ha, ha amighi ezi nkpuru. Nkpuru nke di n'ala ọma ahu, ndia bu ndi were ezi obi di nma jisie okwu ahu ike, mb͕e ha nuru ya, ha were kwa ntachi-obi mia nkpuru. Ma ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nēkpuchi ya n'ihe, ma-ọbu dọba ya n'okpuru ihe-ndina; kama ọ nādọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nke nābà nime we hu ìhè-ya. N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-eme ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe di nzuzo, nke anāgaghi-ama, me kwa ka ọ puta ìhè. Ya mere, lezienu anya otú unu si anu: n'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye; onye ọ bula nēnweghi kwa, ọbuná ihe ọ nēchè na o nwere ka agānapu ya.
LUK 8:4-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe oke igwe mmadụ gbakọrọ ha na ndị mmadụ si nʼobodo dị iche iche bịakwute ya. Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Ọgha mkpụrụ pụrụ ịkụ mkpụrụ ya, mgbe ọ nọ na-agha mkpụrụ ndị a, ụfọdụ nʼime mkpụrụ ahụ dara nʼakụkụ ụzọ ebe ndị mmadụ zọrọ ha ụkwụ, ụmụ nnụnụ bịakwara tụrịa ha loo. Ụfọdụ nʼime ha dakwasịrị nʼelu nkume. Mgbe ha puputara chọọ ito, ha kpọnwụrụ nʼihi na mgbọrọgwụ ha enweghị ike ịmịta mmiri mkpụrụ ahụ ga-eji dị ndụ. Ụfọdụ dara nʼetiti ogwu, ogwu ndị a sooro ha puo ma kpagbuo ha. Ụfọdụ nʼime mkpụrụ dara nʼezi ala. Ha puputara, too, mịa mkpụrụ dị otu narị nʼọnụọgụgụ.” Mgbe o kwusiri nke a, ọ sịrị ha, “Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.” Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ihe ilu a pụtara. Ọ sịrị, “Ọ bụ unu ka e nyere ịmata ihe omimi niile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ ga-anụ ya naanị nʼilu. Site nʼụzọ dị otu a, “ ‘ha ga na-ele anya, ma ha agaghị ahụ ihe ọbụla. Ha ga na-anụ ntị ma ha agaghị aghọta ihe ọbụla.’ “Nke a bụ nkọwa ilu ahụ. Mkpụrụ ahụ bụ okwu Chineke. Mkpụrụ dara nʼakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nʼobi ha, ka ha ghara ikwere ma nwetakwa nzọpụta. Mkpụrụ ndị ahụ dara nʼelu nkume nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya, ma ha enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-ekwere naanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara ha na-adachapụ. Mkpụrụ nke dara nʼetiti ogwu nọchiri anya ndị nụrụ okwu Chineke, ma mgbe ha na-aga nʼụzọ ha, echiche banyere akụ na ihe ụtọ nke ụwa na-akpagbu okwu ahụ, mee ka ha ghara ịmị mkpụrụ. Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nʼezi ala nọchiri anya ndị jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ. “Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ. Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè. Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.”