LUK 8:16-18
LUK 8:16-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ọ dịghị onye ọbụla, nke na-amụnye oriọna zoo ya nʼime igbe maọbụ dọnye ya nʼokpuru ihe ndina. Kama, ọ na-adọkwasị ya nʼelu ihe ịdọba ọkụ ka ndị ọbụla na-abata nʼụlọ ahụ jiri ya hụ ụzọ. Ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị emesịa pụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe ọbụla dị nzuzo nke a na-aghaghị eme ka ọ pụta ìhè. Ya mere, kpacharanụ anya otu unu si ege ntị. Nʼihi na ọ bụ onye ahụ nwere ihe ka a ga-enye karịa, ma onye ahụ na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere, ka a ga-anapụ ya.”
LUK 8:16-18 Bible Nso (IGBOB)
Ma ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ muyere oriọna, nēkpuchi ya n'ihe, ma-ọbu dọba ya n'okpuru ihe-ndina; kama ọ nādọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna, ka ndi nke nābà nime we hu ìhè-ya. N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, nke anāgaghi-eme ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe di nzuzo, nke anāgaghi-ama, me kwa ka ọ puta ìhè. Ya mere, lezienu anya otú unu si anu: n'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye; onye ọ bula nēnweghi kwa, ọbuná ihe ọ nēchè na o nwere ka agānapu ya.