Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 7:36-50

LUK 7:36-50 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Otu onye nʼime ndị Farisii kpọrọ ya oriri. Ọ gara nʼụlọ onye Farisii ahụ, ma nọdụ ala nʼoche nri. Ma otu nwanyị nke bi nʼobodo ahụ, onye birila ndụ mmehie, mgbe ọ matara na ọ nọ nʼụlọ onye Farisii ahụ na-eri nri, o jiri otu karama alabasta mmanụ otite bata nʼụlọ ahụ. Ka o guzoro nʼazụ ụkwụ ya na-ebe akwa, ọ malitere iji anya mmiri ya na-awụsa nʼụkwụ ya. O jiri agịrị isi ya hichaa anya mmiri ahụ, sutu ụkwụ ya ọnụ, ma wụsa mmanụ otite isi ụtọ ahụ na ha. Mgbe onye Farisii ahụ kpọrọ ya oriri hụrụ ihe nke a, o kwuru nʼobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, na ọ bụ onye mmehie.” Jisọs zara ya sị, “Saimọn, e nwere m ihe m chọrọ ịgwa gị.” Ọ sịrị ya, “Onye ozizi gwa m ya.” “Ndị ikom abụọ ji onye na-ebinye ndị mmadụ ego nʼọmụrụnwa ụgwọ. Otu onye ji ya narị ego ise, onye nke ọzọ ji ya iri ego ise. Mgbe ha na-enweghị ike ịkwụghachi ụgwọ ha ji ya, ọ gbaghara ha ụgwọ ahụ. Ugbu a, onye nʼime ha ga-ahụ ya nʼanya karịa?” Saimọn zara sị, “Ọ dị m ka ọ bụ onye nke ọ gbaghara ụgwọ dị ukwuu.” Ọ sịrị ya, “Ị kpeziri.” Mgbe ahụ ọ tụgharịrị nʼebe nwanyị ahụ nọ gwa Saimọn sị, “Ị hụrụ nwanyị a? A batara nʼụlọ gị, i kunyeghị m mmiri ka m saa ụkwụ m, ma nwanyị a ejirila anya mmiri ya sachaa ụkwụ m, jirikwa agịrị isi ya hichaa ha. Ị sutughị m ọnụ, ma kemgbe m batara nʼụlọ a, o zubeghị ike isutu ụkwụ m ọnụ. Ị teghị m mmanụ ọbụla nʼisi, ma lee, o werela mmanụ otite isi ụtọ wụkwasị m nʼụkwụ. Ya mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya niile o mehiere, nʼihi na ọ nwere ịhụnanya dị ukwuu. Ma onye nwetara mgbaghara dị nta, na-enwe ịhụnanya dị nta.” Mgbe ahụ ọ gwara ya sị, “A gbagharala gị mmehie gị.” Ma ndị ọzọ soro ya nọdụ na-eri nri bidoro ikwu nʼetiti onwe ha na-asị, “Onye bụ onye a nwere ike ọ bụladị ịgbaghara mmehie?” Ọ sịrị nwanyị ahụ, “Okwukwe gị azọpụtala gị, laa nʼudo.”

LUK 7:36-50 Bible Nso (IGBOB)

Otù onye n'etiti ndi-Farisi we kpere Ya ka O so ya rie ihe. O we ba n'ulo onye-Farisi ahu, we nọdu na nri. Ma le, otù nwanyi nke nọ n'obodo ahu, bú onye-nmehie; mb͕e ọ mara nke-ọma na Ọ nọduru na nri n'ulo onye-Farisi ahu, o we weta ite alabaster nke manu-otite di ya nime, we guzo n'azu n'ukwu-Ya, nākwa ákwá, we malite iwere anya-miri-ya desa ukwu-Ya abua, o were kwa agiri-isi-ya hicha ha, o we sutu ukwu-Ya ọnu nke-uku, were manu-otite ahu te ha. Ma mb͕e onye-Farisi nke kpọrọ Ya huru ya, o kwue n'onwe-ya, si, Nwoke a, asi na Ọ bu onye amuma, Ọ gāmara onye nwanyi a bu nke nēmetu Ya aka, na aha madu ọ bu, na ọ bu onye-nmehie. Jisus we za, si Ya, Saimon, enwerem okwu M'gāgwa gi. O we si, Onye-ozizí, kwue. Otù onye nke nēbinye madu ihe nwere madu abua ji ya ugwọ: otù onye ji ya nnù shilling na ọgu ise, ibe-ya ji kwa ya ọgu abua na iri. Ebe ha nēnweghi ihe ha gēji kwughachi ya ugwọ, ọ were amara b͕aghara ha abua. Ònye kwa n'etiti ha abua gāhu kari ya n'anya? Saimon we za, si, Ọ dim ka onye o were amara b͕aghara kari. O we si ya, I kpeziri. Mb͕e O chigharisiri n'ebe nwanyi ahu nọ, Ọ si Saimon, Ì huru nwanyi a? Abataram n'ulo-gi, i nyeghi m miri iji sa ukwu: ma nwanyi a were anya-miri-ya desa ukwum, were kwa agiri-isi-ya hicha ha. I sutughm ọnu: ma nwanyi a, site na mb͕e M'batara, ọ rapughi isutu ukwum ọnu nke-uku. I weghi manu tem n'isi: ma nwanyi a were manu-otite tem n'ukwu. N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà. O we si nwayi ahu, Ab͕agharaworo gi nmehie nile gi. Ndi ha na Ya nọduru na nri we malite isirita onwe-ha, Ònye bu Onye a, Nke nāb͕aghara kwa nmehie? O we si nwanyi ahu, Okwukwe-gi azọputawo gi; la n'udo.