Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 6:12-38

LUK 6:12-38 Bible Nso (IGBOB)

O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke. Mb͕e chi bọrọ, Ọ kpọ ndi nēso uzọ-Ya biakute Ya: O we rọputa nime ha madu iri na abua, ndi Ọ kpọ-kwa-ra aha-ha ndi-ozi; Saimon, onye Ọ kpọ-kwa-ra aha-ya Pita, na Andru nwa-nne-ya, na Jemes na Jọn, na Filip na Batọlọmiu, na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis, na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye; O we so ha rida, guzo n'ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n'ọria-ha nile; eme-kwa-ra ka aru-ha di ike, bú ndi mọ nādighi ọcha nēsob͕u. Ìgwè madu ahu nile we chọ imetu Ya aka: n'ihi na ike nēsi n'aru-Ya puta, nēme kwa ka aru di ha nile ike. Ya onwe-ya we welie anya-Ya elu le ndi nēso uzọ-Ya, si, Ngọzi nādiri unu, bú ndi-ob͕eye: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke unu. Ngọzi nādiri unu ndi agu nāgu ub͕u a: n'ihi na afọ gēju unu. Ngọzi nādiri unu ndi nākwa ákwá ub͕u a: n'ihi na unu gāchì ọchì. Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n'ihi Nwa nke madu. Ṅurianu ọṅu n'ubọchi ahu, wuli-kwa-nu elu n'ihi ọṅù: n'ihi na le, ugwọ-ọ́lu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma. Ma ahuhu gādiri unu ndi-ọgaranya: n'ihi na unu nēnwezu nkasi-obi-unu. Ahuhu gādiri unu, ndi afọ juworo ub͕u a: n'ihi na agu gāgu unu. Ahuhu gādiri unu, ndi nāchì ọchì ub͕u a: n'ihi na unu gēru újú kwa kwa ákwá. Ahuhu gādiri unu, mb͕e ọ bula madu nile gēkwu okwu ọma bayere unu: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma ugha. Ma asim unu ndi nānu okwum, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēmenu ihe ọma nye ndi nākpọ uṅu asì, nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu. Onye ọ bula nke nēti gi aka n'otù ǹti, che-kwa-ra ya nke-ọzọ; onye nānapu kwa oké uwe-gi, eb͕ochila ya inara kwa uwe-ime-gi. Nēnye onye ọ bula nāriọ gi; onye nānapu gi ihe-gi, ariọkwala ha n'aka-ya ọzọ. Dika unu nāchọ kwa ka madu mere unu, unu onwe-unu nēme kwa ha otú ahu. Ọ buru kwa na unu ahú ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu ha n'anya. Ọ buru kwa na unu eme ezi ihe nye ndi nēme ezi ihe nye unu, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nēme otù ihe ahu. Ọ buru kwa na unu ewere ihe binye ha, bú ndi unu nēle anya na unu gānata n'aka-ha, àha ekele gini diri unu? ọbuná ndi-nmehie nēwere ihe binye ndi-nmehie, ka ha we nara kwa nke ra ka ya. Ma nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēme-kwa-nu ezi ihe nye ha, nēbinye kwa ihe, ghara iwepu itukwasi-obi; ugwọ-ọlu-unu gādi kwa uku, unu gābu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu: n'ihi na Ya onwe-ya nwere iru-ọma n'ebe ndi nēnweghi ekele na ndi bu ajọ madu nọ. Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere. Ọzọ, unu ekpela ikpé, agaghi-ekpe kwa unu ikpé ma-ọli: unu amakwala ikpé, agaghi-ama kwa unu ikpé ma-ọli: rapunu, agārapu kwa unu: nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n'obi-unu. N'ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ.

LUK 6:12-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼụbọchị ndị ahụ, ọ gara rigoro nʼelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọrọ abalị ahụ niile na-ekpe ekpere nye Chineke. Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị niile na-eso ụzọ ya, site nʼime ha họrọ mmadụ iri na abụọ ndị ọ kpọrọ ndị ozi ya. Saimọn (onye ọ kpọrọ Pita) na Andru nwanne ya, Jemis Jọn, Filip Batalomi. Matiu Tọmọs, Jemis nwa Alfiọs, Saimọn onye a na-akpọ Zilọt. Judas nwa Jemis na Judas Iskarịọt onye raara ya nye. Ya na ha rịdatara ga nʼebe ala dị larịị. Igwe ndị na-eso ụzọ ya na oke igwe mmadụ sitere na Judịa, na Jerusalem nakwa obodo dị na nsọtụ mmiri nke Taịa na Saịdọn. Ndị bịara ịnụrụ okwu ya na ka a gwọọ ha ọrịa ha. A gwọkwara ọtụtụ ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-esogbu. Igwe mmadụ ahụ gbalịrị ịmetụ ya aka, nʼihi na ike dị ukwuu si ya nʼahụ na-apụ na-agwọ ha niile. O weliri anya lee ndị na-eso ụzọ ya, sị ha, “Ngọzị na-adịrị unu bụ ndị ogbenye, nʼihi na alaeze Chineke bụ nke unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị agụụ na-agụ ugbu a, nʼihi na afọ ga-eju unu. Ngọzị na-adịrị unu ndị na-ebe akwa ugbu a, nʼihi na unu ga-achị ọchị. Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, mgbe ha na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-ajụ aha unu, nʼihi Nwa nke Mmadụ. “Ṅụrịanụ ọṅụ ma wuliekwanụ elu nʼihi ọṅụ nʼụbọchị ahụ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na otu a ka ndị nna nna ha mesoro ndị amụma. “Ma ahụhụ na-adịrị unu ndị ọgaranya, nʼihi na unu eketala nkasiobi unu. Ahụhụ na-adịrị ndị afọ juru ugbu a, nʼihi na agụ ga-agụkwa unu. Ahụhụ na-adịrị ndị na-achị ọchị ugbu a, nʼihi na unu ga-eru ụjụ, bee akwa. Ahụhụ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ niile na-ekwu okwu ọma gbasara unu, nʼihi na otu a ka ndị bụ nna ha mesoro ndị amụma ụgha.” “Ma a na m agwa unu ndị na-ege m ntị: hụnụ ndị iro unu nʼanya, mekwaaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma. Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpekwaaranụ ndị na-akparị unu ekpere. Ọ bụrụ na onye ọbụla a maa gị ụra nʼotu ntị, tụgharịara ya ntị gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị. Nye onye ọbụla rịọrọ gị ihe. Ọ bụrụkwa na mmadụ ewere ihe bụ nke gị, agala ịnapụta ya. Dịka unu si chọọ ka ndị mmadụ mesoo unu, sitekwanụ otu a na-emeso ha. “Ọ bụrụ naanị ndị hụrụ unu nʼanya ka unu na-ahụ nʼanya, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ọbụladị ndị mmehie, ọ bụ ndị hụrụ ha nʼanya ka ha na-ahụkwa nʼanya. Ọ bụrụkwa naanị ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka. Ọ bụrụkwa na unu agbazinye naanị ndị nwere ike ịkwụghachi unu ihe, gịnị ga-abụ uru unu? Nʼihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ibe ha na-atụ anya ka a kwụghachikwa ha nʼozuzu oke. Hụnụ ndị iro unu nʼanya, na-emekwa ezi ihe nye ha, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Mgbe ahụ, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ nke Onye kachasị ihe niile elu, nʼihi na ebere ya na-adịrị ndị ajọ omume na ndị na-enweghị mmụọ ekele nʼime ha. Nweenu obi ebere dị ka Nna unu si nwee obi ebere. “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. Unu amala ndị ọzọ ikpe ka a ghara ịma unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu. Nyenụ, nʼihi na a ga-enyekwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ nke juru eju, nke a bịadara nke ọma, yọkọtakwa ayọkọta nke na-ejubiga oke ka a ga-adọkwasị gị nʼahụ; nʼihi na ọ bụ ihe i na-eji atụ ihe ka a ga-eji tụọrọ gị.”