LUK 5:9-11
LUK 5:9-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na o juru ya na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere. Ọ bụladị Jemis na Jọn ụmụ Zebedi, ndị ha na Saimọn na-arụkọ ọrụ, ka ihe a jukwara anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara Saimọn sị, “Atụla egwu, nʼihi na site ugbu a gaa nʼihu, ị ga na-akụta mmadụ.” Mgbe ha kwọpụtara ụgbọ mmiri ha nʼelu ala, ha hapụrụ ihe niile soro ya.
Kesaa
Gụọ LUK 5LUK 5:9-11 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na ibobo ob͕ub͕u azù ha b͕uru nwuru ya na ndi nile ya na ha nọ n'aru; otú ahu ka ibobo nwu-kwa-ra Jemes na Jọn, umu Zebedi, n'aru, ndi ha na Saimon bu ndi-nnweko. Jisus we si Saimon, Atula egwu; site n'ub͕u a i ganānwuta madu na ndu. Mb͕e ha tinyere ubọ-ha n'ala, ha we rapu ihe nile, so Ya.
Kesaa
Gụọ LUK 5