LUK 5:29-32
LUK 5:29-32 Bible Nso (IGBOB)
Livai we siere Ya nri uku n'ulo-ya iji nara Ya nke-ọma: oké ìgwè ndi-ọna-utu na ndi ọzọ di kwa ndi soro ha nọdu na nri. Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ-ha we tamube imegide ndi nēso uzọ-Ya, si, N'ìhi gini ka unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia nēri ihe? Jisus we za, si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi aru di nma; kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma. Abiaghm ikpọ ndi ezi omume kama ọ bu ndi-nmehie ka ha chègharia.
LUK 5:29-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ. Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?” Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”