LUK 5:27-32
LUK 5:27-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe nke a gasịrị, ọ pụrụ hụ otu onye ọna ụtụ aha ya bụ Livayị, ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ ya. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Ngwangwa, o biliri, hapụ ihe niile soro ya. Emesịa, Livayị kwadooro Jisọs oke oriri nʼụlọ ya, ọtụtụ igwe ndị ọna ụtụ na ndị ọzọ soo ha nʼoriri ahụ. Ma ndị Farisii na ndị ozizi iwu tamuru ntamu na-ajụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere unu ji soro ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri na-aṅụkọkwa ihe ọṅụṅụ?” Jisọs zara sị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike. Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”
LUK 5:27-32 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ihe ndia gasiri Ọ pua, hu onye-ọna-utu, nke anākpọ aha-ya Livai, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú, Ọ si ya, Som. O we rapu ihe nile, bilie, so Ya. Livai we siere Ya nri uku n'ulo-ya iji nara Ya nke-ọma: oké ìgwè ndi-ọna-utu na ndi ọzọ di kwa ndi soro ha nọdu na nri. Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ-ha we tamube imegide ndi nēso uzọ-Ya, si, N'ìhi gini ka unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia nēri ihe? Jisus we za, si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi aru di nma; kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma. Abiaghm ikpọ ndi ezi omume kama ọ bu ndi-nmehie ka ha chègharia.