LUK 5:12-16
LUK 5:12-16 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e Ọ nọ n'otù nime obodo ahu, le, otù nwoke nke ekpenta juputara n'aru: ma mb͕e ọ huru Jisus o da kpuchie iru-ya n'ala, riọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha. O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya. Ya onwe-ya we nye ya iwu ka ọ ghara igwa onye ọ bula: Ọ si kwa ya, Kama laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha, dika Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà. Ma okwu bayere Ya fesakariri nke-uku: oké ìgwè madu we nāb͕akọ inu okwu-Ya, ka ewe me kwa aru-ha nke nādighi nma ka ọ di ike. Ma Ya onwe-ya nēwezuga Onwe-ya n'ebe bu ọhia, nēkpe kwa ekpere.
LUK 5:12-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Jisọs nọ nʼotu obodo, otu nwoke onye ekpenta juru ahụ, bịara daa, kpudo ihu ya nʼala mgbe ọ hụrụ ya, rịọ ya sị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, bụrụ onye dị ọcha!” Ngwangwa ekpenta ahụ hapụrụ ya. O nyere ya iwu, “A gwakwala onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu maka ime ka ị dị ọcha, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.” Ma akụkọ banyere ya gbasara karịa, nke mere na igwe mmadụ bịara ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, na ka a gwọọkwa ha nrịa nrịa. Ma site nʼoge ruo nʼoge, Jisọs na-ewezuga onwe ya gaa nʼebe ọ ga-anọ naanị ya ikpe ekpere.