LUK 5:1-4
LUK 5:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n'usọ ọdọ-miri Genesaret; O we hu ub͕ọ abua ka ha guzoro n'usọ ọdọ-miri ahu: ma ndi-ọkù esiwori nime ha pua, ha nāsa kwa ihe ha ji eb͕u azù. O we ba n'otù nime ub͕ọ abua ahu, nke bu nke Saimon, we kpere ya ka o si n'ala nupu nke-ntà. O we nọdu, si n'ub͕ọ nēzí ìgwè madu nile ihe. Ma mb͕e O kwubìri okwu, Ọ si Saimon, Nupu n'ob͕u-miri, wunyenu ihe unu ji eb͕u azù ka unu b͕ue azù.
LUK 5:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu oge, ka Jisọs guzo nʼakụkụ ọdọ mmiri Genesaret. Igwe mmadụ gbara ya gburugburu ka ha nụrụ okwu Chineke. Ọ hụrụ nʼọnụ mmiri ahụ, ụgbọ mmiri abụọ nke ndị ọkụ azụ nwe ha hapụrụ gaa ịsa ụgbụ ha ji egbu azụ. Ọ banyere nʼime otu ụgbọ mmiri ndị ahụ, nke bụ nke Saimọn, ọ rịọrọ ya ka ọ kwọrọ ya banyetụ ntakịrị nʼime mmiri. Ọ nọdụrụ ala nʼime ya bido na-ezi igwe mmadụ ihe. Mgbe o kwusiri okwu, ọ gwara Saimọn sị, “Banyetụkwuo nʼime mmiri, tụnye ụgbụ gị ka i gbute azụ.”