LUK 4:3-13
LUK 4:3-13 Bible Nso (IGBOB)
Ekwensu we si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọ ob͕e achicha. Jisus we za ya, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu. Ọ we duru Ya rigo, we gosi Ya ala-eze nile nke elu-uwa dum madu bi na nkenke oge. Ekwensu we si Ya, Gi ka m'gēnye ike a nile, na ebube-ha: n'ihi na ararawo ya nye n'akam; onye ọ bula m'chọ-kwa-ra inye ya m'nye ya. Ya mere ọ buru na Gi onwe-gi gākpọ isi ala n'irum, ihe a nile gābu nke Gi. Jisus we za, si ya, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere. O we duru Ya ga Jerusalem, guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'ebe a tuda Onwe-gi n'ala: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi: Ọzọ, Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya. Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi. Mb͕e ekwensu nwasiri ọnwunwa nile, o we si n'ebe Ọ nọ pua rue mb͕e ọzọ.
LUK 4:3-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.” Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’ ” Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya. Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha. Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.” Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye Onyenwe anyị Chineke gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’ ” Ekwensu duuru ya gaa Jerusalem, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, si nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichekwa gị nke ọma; ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’” Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị ọnwụnwa. ” Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara.