Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 4:14-30

LUK 4:14-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Jisọs lọghachiri na Galili nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile. O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya. Mgbe o rutere Nazaret ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị, “Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha. Ikwupụta afọ Onyenwe anyị ga-eme amara.” O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya. Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.” Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke Josef?” Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ”   Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala Izrel afọ atọ na ọnwa isii. Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo Zarefat nʼakụkụ Saịdọn. Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala Izrel, ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa Neeman onye Siria.” Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya.

LUK 4:14-30 Bible Nso (IGBOB)

Jisus we laghachi na Galili n'ike Mọ Nsọ: ùdé-Ya we pua jesa n'ala dum di buruburu. Ya onwe-ya we nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, madu nile nēnye kwa Ya otuto. O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ. Ewe nye Ya akwukwọ Aisaia onye-amuma n'aka. Ó we meghe akwukwọ ahu, chọta ebe edeworo ya, si, Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum. N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma: O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi, Izipu ndi etihiawara aru ka ha la, Ikwusa arọ mb͕e Onye-nwe-ayi nānara madu nke-ọma. O we kpuchie akwukwọ ahu, were ya nyeghachi onye nējere ha ozi, we nọdu ala: ndi nile nọ n'ulo-nzukọ ahu we nēlegide Ya anya. O we malite isi ha, Ta ka emezuworo ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ na nti-unu. Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef? O we si ha, N'ezie unu gaturu m ilu a, Dibia, me ka aru Gi onwe-gi di ike: ka ihe ayi nuru na emere ha na Kapanaum ra, me kwa otú a n'ebe a n'obodo nke aka Gi. O we si, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye-amuma ọ bula nke anara nke-ọma n'obodo nke aka ya. Ma n'ezie ka M'nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n'ala Israel n'ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n'ala ahu nile; ma ọ dighi onye ọ bula nime ha ezigara Elaija, kama nání Zarefat, n'ala Saidon, jekuru nwanyi di-ya nwuru. Ọtutu ndi-ekpenta di kwa n'Israel na mb͕e Elaisha onye-amuma; ma ọ dighi onye ọ bula nime ha emere ka ọ di ọcha, kama nání Neamam onye Siria. Ọnuma we juputa ha nile n'ulo-nzukọ ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia; ha we bilie, chupu Ya n'obodo ahu, duru Ya ga rue mpempe ugwu nke ewuru obodo-ha n'elu ya, ka ha we kwada Ya n'ala. Ma Ya onwe-ya gabigara n'etiti ha la.