LUK 3:16-22
LUK 3:16-22 Bible Nso (IGBOB)
Jọn zara, si ha nile, Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie; ma Onye kam ike nābia, Onye m'nērughi itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism: Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, ifuchapu ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, na ikpokọta ọka-Ya n'ọba-Ya; ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o. Ya mere o ji ọtutu ndumọdu di iche iche zì ndi-Ju ozi ọma; ma Herod, bú tetrarch, ebe Jọn turu ya nmehie-ya n'anya, bú ihe bayere Herodias nwunye nwa-nna-ya, na ihe bayere ajọ ihe nile Herod mere, ọ tukwasi-kwara nka n'elu ihe nile, na o mechibidoro Jọn n'ulo-nkpọrọ. Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe, Mọ Nsọ we fedakwasi Ya n'oyiyi aru, dika nduru, olu we site n'elu-igwe, si, Gi onwe-gi bu Ọkparam M'huru n'anya; ihe-Gi dim ezi mma.
LUK 3:16-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim. Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.” O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma. Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere, tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ. Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere. Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.”