LUK 24:44-53
LUK 24:44-53 Bible Nso (IGBOB)
O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem. Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n'akwukwọ nsọ; O we si ha, Otú a ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n'ubọchi nke-atọ; na agēkwusa kwa nchèghari na nb͕aghara nmehie n'aha-Ya gwa mba nile, nāmalite site na Jerusalem. Unu onwe-unu bu ndi-àmà nke ihe ndia. Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n'isi-unu: ma nọdunu n'obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n'elu yikwasi unu. O we dupu ha rue n'uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha. O we rue, mb͕e Ọ nāgọzi ha, na Ọ kewapuru n'ebe ha nọ, ewe welie Ya la n'elu-igwe. Ndi ahu we kpọ isi ala nye Ya, we ji oké ọṅù laghachi na Jerusalem: ha we nānọ n'ulo uku Chineke mb͕e nile, nāgọzi Chineke.
LUK 24:44-53 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a. Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.” O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha. Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe. Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem. Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.