Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 24:36-53

LUK 24:36-53 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ. Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ? Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.” Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?” Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha. Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a. Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.” O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha. Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe. Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem. Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.

LUK 24:36-53 Bible Nso (IGBOB)

Ma mb͕e ha nēkwu ihe ndia, Ya onwe-ya guzoro n'etiti ha, si ha, Udo diri uno. Ma ha turu ujọ, tu kwa egwu, ha we chè na ha huru mọ. O we si ha, Gini mere obi nālọ unu miri? n'ìhi gini ka iru-uka nēbili kwa n'obi-unu? Lenu akam na ukwum, na ọ bu Mu onwem: datunum aka, le-kwa-nu; n'ihi na mọ enweghi anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere. Mb͕e O kwusiri nka, O we gosi ha aka-Ya na ukwu-Ya. Ma mb͕e ha nọ nēkweghi ekwe n'ihi ọṅù, mb͕e ọ nēju kwa ha anya, Ọ si ha, Ùnu nwere ihe-oriri ọ bula n'ebe a? Ha we nye Ya òkè nime azù aruru aru. O we nara ya, rie n'iru ha. O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem. Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n'akwukwọ nsọ; O we si ha, Otú a ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n'ubọchi nke-atọ; na agēkwusa kwa nchèghari na nb͕aghara nmehie n'aha-Ya gwa mba nile, nāmalite site na Jerusalem. Unu onwe-unu bu ndi-àmà nke ihe ndia. Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n'isi-unu: ma nọdunu n'obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n'elu yikwasi unu. O we dupu ha rue n'uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha. O we rue, mb͕e Ọ nāgọzi ha, na Ọ kewapuru n'ebe ha nọ, ewe welie Ya la n'elu-igwe. Ndi ahu we kpọ isi ala nye Ya, we ji oké ọṅù laghachi na Jerusalem: ha we nānọ n'ulo uku Chineke mb͕e nile, nāgọzi Chineke.