LUK 24:28-35
LUK 24:28-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya. Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha. Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha. Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ. Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?” Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe, na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.” Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha.
LUK 24:28-35 Bible Nso (IGBOB)
Ha we biarue obodo ntà ahu nso, ebe ha nāga: ma Ya onwe-ya mere dika Ọ nāga n'iru. Ha we rugide Ya, si, Nọyere ayi: n'ihi na o rubewo anyasi, ubọchi agamiwo kwa ub͕u a. O we ba n'ulo inọyere ha. O we rue, mb͕e Ya na ha nọdusiri na nri, na O were ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, we nēnye ha. Ewe saghe anya-ha, ha we mara Ya; Ya onwe-ya we funari n'anya-ha. Ha we sirita onwe-ha, Òbi-ayi ekpoghi ọku nime ayi, mb͕e Ọ nāgwa ayi okwu n'uzọ, mb͕e Ọ nēmeghere ayi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ? Ha we bilie n'oge hour ahu, laghachi na Jerusalem, we hu ndi-ozi iri na otù ahu, na ndi ha na ha nọ, ka ha zukọrọ, nāsi, N'ezi-okwu Onye-nwe-ayi esiwo n'ọnwu bilie, were kwa Onwe-ya gosi Saimon. Ha onwe-ha we kọ ihe mere n'uzọ, na otú ha mara Ya n'inyawa ob͕e achicha ahu.