Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 24:13-53

LUK 24:13-53 Bible Nso (IGBOB)

Ma le, ubọchi ahu ndikom abua nime ha nāga otù obodo ntà, aha-ya bu Emeus, nke di ọgu mail atọ site na Jerusalem. Ndi ahu nākparita kwa n'etiti onwe-ha uka bayere ihe ndia nile mereri. O we rue, mb͕e ha nākparita uka nājurita kwa onwe-ha ajuju, Jisus onwe-ya we biarue nso, so kwa ha ga. Ma eb͕ochiri ha anya ka ha ghara ima Ya. O we si ha, Gini bu okwu ndia unu nāgwarita onwe-unu, ka unu nāga ije? Ha we guzo nāb͕aru iru. Otù onye nime ha, aha-ya bu Kleopas, we za, si Ya, Ọ̀ bu nání Gi onwe-gi nọ dika ọbìa na Jerusalem nāmaghi ihe mere nime ya n'ubọchi ndia? Ọ si ha, Ihe gini? Ha si Ya, Ihe bayere Jisus Onye Nazaret, Onye bu onye-amuma di ike n'ọlu na okwu n'iru Chineke na ndi-Ju nile: ya na otú ndi-isi-nchu-àjà na ndi-isi-ayi rara Ya nye ka ama Ya ikpé ọnwu, we kpọgide Ya n'obe. Ma ayi onwe-ayi lere anya na Ya onwe-ya bu onye gaje ib͕aputa Israel. E, tukwasi kwa ihe ndia nile, ta bu ubọchi nke-atọ site na mb͕e ihe ndia mere. Ma ndinyom ufọdu n'etiti ayi mekwara ka ibobo nwua ayi n'aru, n'ihi na ha jere ílì-Ya n'isi-ututu; mb͕e ha nāhughi aru-Ya, ha we bia, si, na ha hukwarari ọhù, bú ndi-mọ-ozi, ndi siri na Ọ di ndu. Ufọdu n'etiti ndi soro ayi we je ílì ahu, hu kwa ya ọbuná otú ndinyom ahu kwuru: ma Ya onwe-ya ka ha nāhughi. Ya onwe-ya we si ha, Unu ndi nēnweghi uche, ndi di kwa urè n'obi ikwere n'ihe nile ndi-amuma kwuru! Ọ̀ bughi na Kraist aghaghi ihu ahuhu ndia, na ibà n'ebube-Ya? O we malite isi n'akwukwọ Moses, si kwa n'akwukwọ ndi-amuma nile, me ka ha mata isi okwu bayere Onwe-ya n'ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ. Ha we biarue obodo ntà ahu nso, ebe ha nāga: ma Ya onwe-ya mere dika Ọ nāga n'iru. Ha we rugide Ya, si, Nọyere ayi: n'ihi na o rubewo anyasi, ubọchi agamiwo kwa ub͕u a. O we ba n'ulo inọyere ha. O we rue, mb͕e Ya na ha nọdusiri na nri, na O were ob͕e achicha, gọzie ya, nyawa ya, we nēnye ha. Ewe saghe anya-ha, ha we mara Ya; Ya onwe-ya we funari n'anya-ha. Ha we sirita onwe-ha, Òbi-ayi ekpoghi ọku nime ayi, mb͕e Ọ nāgwa ayi okwu n'uzọ, mb͕e Ọ nēmeghere ayi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ? Ha we bilie n'oge hour ahu, laghachi na Jerusalem, we hu ndi-ozi iri na otù ahu, na ndi ha na ha nọ, ka ha zukọrọ, nāsi, N'ezi-okwu Onye-nwe-ayi esiwo n'ọnwu bilie, were kwa Onwe-ya gosi Saimon. Ha onwe-ha we kọ ihe mere n'uzọ, na otú ha mara Ya n'inyawa ob͕e achicha ahu. Ma mb͕e ha nēkwu ihe ndia, Ya onwe-ya guzoro n'etiti ha, si ha, Udo diri uno. Ma ha turu ujọ, tu kwa egwu, ha we chè na ha huru mọ. O we si ha, Gini mere obi nālọ unu miri? n'ìhi gini ka iru-uka nēbili kwa n'obi-unu? Lenu akam na ukwum, na ọ bu Mu onwem: datunum aka, le-kwa-nu; n'ihi na mọ enweghi anu-aru na ọkpukpu, otú unu huru na Mu onwem nwere. Mb͕e O kwusiri nka, O we gosi ha aka-Ya na ukwu-Ya. Ma mb͕e ha nọ nēkweghi ekwe n'ihi ọṅù, mb͕e ọ nēju kwa ha anya, Ọ si ha, Ùnu nwere ihe-oriri ọ bula n'ebe a? Ha we nye Ya òkè nime azù aruru aru. O we nara ya, rie n'iru ha. O we si ha, Ndia bu okwum nke M'gwara unu, mb͕e Mu na unu nọ-kwa-ra, na ihe nile aghaghi imezu, bú nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses, na ndi-amuma, na abù ọma bayerem. Mb͕e ahu ka O meghere uche-ha, ka ha we ghọta ihe edeworo n'akwukwọ nsọ; O we si ha, Otú a ka edeworo ya n'akwukwọ nsọ, na Kraist ahu gāhu ahuhu, si kwa na ndi nwuru anwu bilie n'ubọchi nke-atọ; na agēkwusa kwa nchèghari na nb͕aghara nmehie n'aha-Ya gwa mba nile, nāmalite site na Jerusalem. Unu onwe-unu bu ndi-àmà nke ihe ndia. Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwà nke Nnam n'isi-unu: ma nọdunu n'obodo a, rue mb͕e agēwere ike nke si n'elu yikwasi unu. O we dupu ha rue n'uzọ Betani: O we chilie aka-Ya elu, gọzie ha. O we rue, mb͕e Ọ nāgọzi ha, na Ọ kewapuru n'ebe ha nọ, ewe welie Ya la n'elu-igwe. Ndi ahu we kpọ isi ala nye Ya, we ji oké ọṅù laghachi na Jerusalem: ha we nānọ n'ulo uku Chineke mb͕e nile, nāgọzi Chineke.

LUK 24:13-53 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼotu ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ nʼime ha gaje nʼobodo nta a na-akpọ Emaus, nke dị ihe ruru kilomita iri na abụọ site na Jerusalem. Ha na-ekwurịta nʼetiti onwe ha banyere ihe niile mere. Dị ka ha na-ekwu na-akparịta ụka banyere ihe ndị a, Jisọs nʼonwe ya bịara soro ha na-aga ije. Ma e mechiri anya ha ịmata na ọ bụ ya. Ọ sịrị ha, “Gịnị ka unu na-ekwurịta nʼetiti onwe unu dị ka unu na-aga nʼụzọ.” Ha kwụsịrị ebe ahụ, gbarụọ ihu ha. Otu onye nʼime ha a na-akpọ Kleopas, sịrị ya, “Ị bụ onye ọbịa na Jerusalem nke mere na ị maghị ihe mere nʼime ya nʼụbọchị ndị a?” Ọ sịrị ha, “Gịnị bụ ihe mere?” Ha sịrị ya, “Banyere Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma bụrụkwa onye dị ike, ma nʼokwu ma nʼomume nʼihu Chineke na mmadụ niile. Na otu ndịisi nchụaja na ndị ọchịchị anyị nyefere ya ka a maa ya ikpe ọnwụ, ma kpọgbukwaa ya nʼobe. Anyị nwererịị olileanya na ọ bụ ya ga-agbapụta Izrel. Nke ka nke, taa mere ya abalị atọ kemgbe ihe ndị a mere. Tụkwasị ihe ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị anyị mere ka anyị nwee ihe ịtụnanya. Ha gara nʼili ahụ nʼisi ụtụtụ a. Ma ha ahụghị ahụ ya. Ha bịara kọrọ anyị na ha hụrụ ọhụ nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị gwara ha na ọ dị ndụ. Ya mere ụfọdụ nʼime ndị otu anyị gara nʼili ahụ chọpụta na ihe niile ụmụ nwanyị a kwuru mere otu ahụ ha siri kwuo ya. Ma ha ahụkwaghị ya.” Ọ sịrị ha, “Unu bụ nnọọ ndị nzuzu! Leenụ ka o si siere unu ike ikwere ihe niile ndị amụma kwuru. Ọ bụ na o kwesighị ka Kraịst taa ahụhụ ndị a tupu ọ banye nʼebube ya?” Ya mere, ọ kọwaara ha ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ banyere ya onwe ya malite na nke Mosis ruo na ndị amụma niile. Mgbe ha na-eru obodo nta ahụ ha na-aga, o mere dị ka ọ na-aga nʼihu na njem ya. Ma ha rịọ ya nʼebe ọ dị ukwuu sị, “Nọnyerenụ anyị nʼihi na chi ebidola iji, ụbọchị agamiekwala ugbu a.” Nʼihi ya ọ banyere ịga nọnyere ha. Mgbe ya na ha nọdụrụ na tebul iri nri, o were achịcha, kelee Chineke ekele, nyawaa ya were ya nye ha. Mgbe ahụ, e meghere anya ha, ha amata onye ọ bụ, ha ahụkwaghị ya anya ọzọ. Mgbe ahụ, ha gwara onwe ha sị, “Ọ bụ na ọ dịghị ka ọkụ ọ na-enwu nʼobi anyị mgbe anyị na ya nọ nʼụzọ, ya na-ekpughere anyị akwụkwọ nsọ?” Ha biliri ngwangwa laghachi Jerusalem. Ebe ahụ, ha hụrụ mmadụ iri na otu ahụ na ndị so ha ka ha nọkọtara nʼotu ebe, na-asị, “Ọ bụ eziokwu, Onyenwe anyị ebiliela, o gosila Saimọn onwe ya.” Mgbe ahụ, ha kọọrọ ha ihe mere nʼụzọ, ya na otu ha siri mata ya mgbe ọ nyawara achịcha. Mgbe ha ka na-ekwu banyere nke a, ya onwe ya guzooro nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” Oke egwu tụrụ ha, obi lọkwara ha mmiri nʼihi na ha chere na ha ahụla mmụọ. Ma ọ sịrị ha, “Gịnị mere ụjọ ji atụ unu, gịnị mere unu ji nwee obi abụọ? Leenụ m anya nʼaka na nʼụkwụ. Ọ bụ mụ onwe m! Metụnụ m aka ka unu hụrụ, nʼihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ na ọkpụkpụ dị ka unu hụrụ m nwere.” Mgbe o kwuchara nke a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. Ma dị ka o siiri ha ike ikwere nʼihi ọṅụ na oke mgbagwoju anya, ọ sịrị ha, “Ọ dị ihe oriri unu nwere ebe a?” Ha nyere ya otu ntakịrị azụ a mịkpọrọ amịkpọ. Ma ọ naara ya rie ya nʼihu ha. Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Okwu ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu nọ, na ihe niile e dere nʼiwu Mosis na ndị Amụma na nʼAbụ Ọma banyere m ga-emezucha.” Mgbe ahụ, o meghere akọnuche ha ka ha ghọta akwụkwọ nsọ. Ọ sịrị ha, “Nke a bụ ihe e dere na, Kraịst ahụ ga-ahụ ahụhụ ma sitekwa nʼọnwụ bilie nʼụbọchị nke atọ. Na a ga-ekwusa nchegharị na mgbaghara mmehie site nʼaha ya nye mba niile, malite na Jerusalem. Unu bụ ndị akaebe nke ihe ndị a. Ma lee, agaje m izitere unu ihe ahụ Nna m kwere na nkwa. Ya mere, nọrọnụ nʼime obodo ruo mgbe a ga-eyikwasị unu ike nke si nʼelu.” O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha. Dị ka ọ na-agọzi ha, ọ sitere nʼebe ha nọ pụọ, e weliri ya elu, baa nʼeluigwe. Mgbe ahụ, ha fere ya ofufe jiri oke ọṅụ laghachi na Jerusalem. Ha nọgidere nʼụlọnsọ ukwu ahụ na-eto Chineke oge niile.