LUK 22:67-71
LUK 22:67-71 Bible Nso (IGBOB)
Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist, gwa ayi. Ma Ọ siri ha, Ọ buru na Mu agwa unu, unu agaghi-ekwe ma-ọli: ma ọ buru na Mu aju unu ajuju, unu agaghi-aza ma-ọli. Ma site n'ub͕u a ka Nwa nke madu gānọdu n'aka-nri nke ike Chineke. Ha nile si, Gì onwe-gi bu kwa Ọkpara Chineke? Ọ si ha, Unu onwe-unu si na Mu onwem bu Ya. Ha we si, Ọ̀ bu nkpà àmà gini nākpa ayi ọzọ? n'ihi na ayi onwe-ayi nuru site n'ọnu-Ya.
LUK 22:67-71 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha na-ekwu, “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.” Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwe. Ọ bụrụkwa na m ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza m. Ma site ugbu a gawa, Nwa nke Mmadụ ga-anọdụ ala nʼaka nri nke ike Chineke.” Ha niile sịrị, “Gị onwe gị, ị bụ Ọkpara Chineke?” Ọ sịrị ha, “Unu kwuru na Abụ m.” Mgbe ahụ ha sịrị, “Gịnị mere anyị ji na-achọ onye akaebe ọzọ? Anyị ejirila ntị anyị nụrụ ya site nʼọnụ ya.”