LUK 22:60-62
LUK 22:60-62 Bible Nso (IGBOB)
Ma Pita siri, Nwoke, amataghim ihe i nēkwu. Ngwa ngwa, mb͕e ọ kpu okwu n'ọnu, oke-ọkuku we kwa ákwá. Onye-nwe-ayi we chigharia, le Pita anya. Pita we cheta okwu Onye-nwe-ayi, otú Ọ siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ta, i gāgọnarim ub͕ò atọ. O we pua, kwa ákwá nke-uku.
Kesaa
Gụọ LUK 22LUK 22:60-62 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Pita sịrị, “Nwoke m, amaghị m ihe ị na-ekwu maka ya?” Dị ka ọ kpụ okwu ahụ nʼọnụ, oke ọkpa kwara akwa. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị tụgharịrị lee Pita anya. Pita chetakwara okwu Onyenwe anyị gwara ya nke bụ, “Tupu oke ọkpa akwa akwa taa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Ma ọ pụrụ nʼezi gaa bee akwa na mwute.
Kesaa
Gụọ LUK 22