LUK 22:45-53
LUK 22:45-53 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe o kpechara ekpere bilie, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya hụ ha ka ha na-arahụ ụra nʼihi ihe mwute nke obi. Ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.” Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, igwe mmadụ bịara, onye du ha bụ onye a na-akpọ Judas, bụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya. Ọ bịaruru Jisọs nso, isutu ya ọnụ. Ma Jisọs sịrị ya, “Judas, ọ bụ site nʼisutu ọnụ ka i ji arara Nwa nke Mmadụ nye?” Mgbe ndị nọ ya gburugburu hụrụ ihe gaje ime, ha sịrị, “Onyenwe anyị, ọ bụ anyị were mma agha gbuo?” Otu nʼime ha ji mma gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị aka nri ya. Ma Jisọs sịrị, “O zuola!” O metụkwara ntị nwoke ahụ aka gwọọ ya. Mgbe ahụ, Jisọs sịrị ndịisi nchụaja, na ndị nlekọta nke ụlọnsọ ukwu na ndị okenye, “Gịnị mere unu ji chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m, dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi o ji egbe ezu? Mgbe mụ na unu na-anọ kwa ụbọchị nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ma unu emetụghị m aka. Ma ugbu a bụ oge awa unu bụrụkwa mgbe ike ọchịchịrị na-achị achị.”
LUK 22:45-53 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e O biliri n'ekpere-Ya, O we biakute ndi nēso uzọ-Ya, Ọ hu ha ka ha nāraru ura site n'ihe-nwuta, O we si ha, Gini mere unu nāraru ura? bilienu nēkpe kwa ekpere, ka unu we ghara ibà n'ọnwunwa. Mb͕e Ọ kpu okwu n'ọnu, le, ìgwè madu biara; onye ahu anākpọ Judas, bú otù onye n'etiti ndi-ozi iri na abua ahu, buru kwa ha uzọ nābia; o we bia rue Jisus nso isutu Ya ọnu. Ma Jisus siri ya, Judas, ì ji isutu-ọnu nārara Nwa nke madu nye? Ma mb͕e ndi nọ Ya gburugburu huru ihe gādi, ha si, Onye-nwe-ayi, àyi gēwere mma-agha b͕ue? Otù onye nime ha we b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma Jisus zara, si, Kwenu ya rue nka. O we metu nti-ya aka, me ka aru di ya ike. Jisus we si ndi-isi-nchu-àjà, na ndi-ọchi-agha nke ulo uku Chineke, na ndi-okenye, ndi biara imegide Ya, Ùnu putara chiri mma-agha na osisi, dika imegide onye nāpunara madu ihe? Mb͕e Mu na unu nọ kwa-ubọchi n'ulo uku Chineke, unu esetighi aka-unu imegidem: ma nka bu oge hour unu, na ike nke ọchichiri.