LUK 22:41-44
LUK 22:41-44 Bible Nso (IGBOB)
Ewe weputa Ya onwe-ya n'etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n'ala we nēkpe ekpere, si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ. Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike. Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala.
LUK 22:41-44 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị, “Nna ọ bụrụ na ị chọrọ, nara m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mezuo uche gị.” Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume. Site nʼoke ihe mgbu, o kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nʼahụ na-adapụ nʼala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.