LUK 22:38-44
LUK 22:38-44 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha sịrị, “Onyenwe anyị, lee mma agha abụọ dị ebe a.” Ọ sịrị ha, “Nke ahụ ezuola.” Jisọs pụrụ gaa nʼUgwu Oliv dị ka ọ na-eme mgbe dum, ndị na-eso ụzọ ya sokwa ya gaa. Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ sịrị ha, “Kpeenụ ekpere ka unu ghara ịdaba nʼọnwụnwa.” Ọ hapụrụ ha gaa ihe ha ka nzọ ụkwụ ole na ole nọrọ nʼebe ahụ gbuo ikpere nʼala kpee ekpere, sị, “Nna ọ bụrụ na ị chọrọ, nara m iko a, ma otu ọ dị, ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mezuo uche gị.” Otu mmụọ ozi si nʼeluigwe bịakwutere ya, gbaakwa ya ume. Site nʼoke ihe mgbu, o kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nʼahụ na-adapụ nʼala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.
LUK 22:38-44 Bible Nso (IGBOB)
Ha we si, Onye-nwe-ayi, le, mma-agha abua di n'ebe a. O we si ha, O zuwo. O we puta, ga ugwu Olive, dika Ọ nēme mb͕e dum; ndi nēso uzọ-Ya soro kwa Ya. Ma mb͕e O ruru n'ebe ahu, Ọ siri ha, Nēkpenu ekpere ka unu ghara ibà n'ọnwunwa. Ewe weputa Ya onwe-ya n'etiti ha dika ebe agāturu nkume; O we b͕ue ikperè n'ala we nēkpe ekpere, si, Nna, ọ buru na ọ di Gi nma, naram iko a: otú ọ di, ka eme ihe Gi onwe-gi nāchọ, ọ bughi ihe Mu onwem nāchọ. Ewe me ka Ọ hu mọ-ozi nke si n'elu-igwe bia, nēnye Ya ike. Ma ebe o nēb͕u Ya nb͕u n'obi ri nne Ọ kpe ekpere si-ike karia: ọsusọ-Ya we ghọ ihe dika oké ọkpurukpu ọbara nāda n'ala.