LUK 21:34-36
LUK 21:34-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.”
Kesaa
Gụọ LUK 21LUK 21:34-36 Bible Nso (IGBOB)
Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà; n'ihi na otù a ka ọ gābiakwasi ndi nile bi n'elu uwa nile. Ma murunu anya n'oge ọ bula, nāriọ aririọ, ka unu we nwe ike ib͕anari ihe nile ndia nke gaje ime, na iguzo n'iru Nwa nke madu.
Kesaa
Gụọ LUK 21