LUK 21:20-38
LUK 21:20-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Mgbe unu hụrụ ka ndị agha gbara Jerusalem gburugburu, matanụ na oge e ji ala ya nʼiyi eruola. Nʼoge ahụ ka ndị nọ na Judịa gbalaga nʼugwu, ka ndị nọ nʼime obodo si na ya pụta, ka ndị na-anọghị nʼobodo gharakwa ịba nʼime ya. Nʼihi na oge a ga-abụ oge ịbọ ọbọ ka e mezuo ihe niile akwụkwọ nsọ kwuru. Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime, na ndị na-enye ụmụaka ara, nʼụbọchị ahụ! A ga-enwe oke ihe mgbu nʼala a, iwe ga-adakwasịkwa ụmụ mmadụ. Mma agha ga-egbu ha, mba niile ga-adọrọkwa ha nʼagha. Ndị mba ọzọ ga na-azọtọsị Jerusalem nʼụkwụ ruo mgbe oge nke ndị mba ọzọ ahụ zuru. “A ga-enwe ihe ịrịbama nʼanyanwụ, nʼọnwa, na kpakpando. Nʼelu ụwa, mba niile ga-anọ nʼoke ahụhụ na mgbagwoju anya dị ka oke osimiri na-eme mkpọtụ, ebili mmiri ga na-ebilikwa. Ndị mmadụ ga-adakwa mba nʼobi nʼihi ụjọ mgbe ha ghọtara ihe gaje ịbịakwasị ụwa, nʼihi na a ga-eme ka ike niile nke dị nʼeluigwe maa jijiji. Nʼoge ahụ, a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼike na ebube nʼigwe ojii. Mgbe ihe ndị a malitere ime, guzoronụ ọtọ welie isi unu elu, nʼihi na oge mgbapụta unu dị nso.” Ọ tụụrụ ha ilu a, “Leenụ osisi fiig na osisi ndị ọzọ niile anya. Mgbe ha bidoro ipupụta ahịhịa ọhụrụ, unu na-amata na ọkọchị adịla nso. Nʼụzọ dị otu a kwa, mgbe unu hụrụ ihe ndị a niile ka ha na-eme, matanụ na alaeze Chineke adịla nso. “Nʼezie agwa m unu, ọgbọ a agaghị agabiga tupu ihe ndị a niile emezuo. Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu m enweghị ike ịgabiga. “Kpachapụkwanụ anya, unu ekwela ka e bogbuo obi unu site nʼoke oriri na ọṅụṅụ na nchekasị nke ndụ a, site otu a mee ka ụbọchị ahụ bịakwasị unu na mberede, dị ka ọnya. Nʼihi na ọ ga-abịakwasị ndị niile bi nʼelu ụwa. Nọrọnụ na nche oge niile ma na-ekpekwanụ ekpere ka unu nwee ike ịgbanarị ihe niile gaje ịbịa, ka unu nweekwa ike iguzo nʼihu Nwa nke Mmadụ.” Kwa ụbọchị, ọ na-ezi ihe nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ma nʼuhuruchi, ọ na-arịgoro nʼelu Ugwu Oliv ị ga nọọ ọnọdụ abalị. Ndị mmadụ niile na-abịakwute ya nʼisi ụtụtụ niile nʼụlọnsọ ukwu ịnụrụ okwu ya.
LUK 21:20-38 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e ọ bula unu gāhu Jerusalem ka achi usu-ndi-agha nọgide ya gburugburu, mb͕e ahu maranu na itọb͕ọrọ-n'efu-ya di nso. Mb͕e ahu ndi nọ na Judia, ka ha b͕alaga n'ugwu; ndi nọ kwa n'etiti ya, ka ha si nime ya wezuga onwe-ha; ndi nọ kwa n'ala ọzọ, ka ha ghara ibà nime ya. N'ihi na ndia bu ubọchi nkpeputa, ka ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ we mezu. Ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu; n'ihi na oké nkpà gādi n'ala nka, iwe gādi-kwa-ra ndi-Ju. Ha gāda kwa site n'ọnu mma-agha, agādọta kwa ha n'agha ga na mba nile: ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n'ala, rue mb͕e oge nke mba ọzọ gēmezu. Ihe-iriba-ama di iche iche gādi kwa n'anyanwu na ọnwa na kpakpando; n'elu uwa ka nkpab͕u nke mba di iche iche gādi kwa, ndi nọ n'obi abua n'ihi nbib͕o nke oké osimiri na ebili-miri; madu nātub͕ọ site n'egwu, site kwa na ile-anya ihe nābiakwasi n'elu-uwa dum madu bi: n'ihi na agēme ka ike nile nke elu-igwe me nkpatu. Mb͕e ahu ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'igwe-oji, Ya na ike na oké ebube. Ma mb͕e ihe ndia malitere ime, lenu anya n'elu, welikwanu isi-unu; n'ihi na nb͕aputa-unu nēru nso. O we turu ha ilu: Lenu osisi fig, na osisi nile: mb͕e ọ bula ha púru epú ub͕u a, unu huru ya mara kwa n'onwe-unu na mb͕e okpom-ọku di nso ub͕u a. Otú a unu onwe-unu kwa, mb͕e ọ bula unu gāhu ihe ndia ka ha nāputa, maranu na ala-eze Chineke di nso. N'ezie asim unu, Ọbọ a agaghi-agabiga ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme. Elu-igwe na uwa gāgabiga: ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli. Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà; n'ihi na otù a ka ọ gābiakwasi ndi nile bi n'elu uwa nile. Ma murunu anya n'oge ọ bula, nāriọ aririọ, ka unu we nwe ike ib͕anari ihe nile ndia nke gaje ime, na iguzo n'iru Nwa nke madu. Kwa-ubọchi O nēzí ihe n'ulo uku Chineke; kwa-abali Ọ nāpu, nānọ ọnọdu-abali n'ugwu anākpọ ugwu Olive. Ndi-Ju nile nābiakute kwa Ya n'isi-ututu n'ulo uku Chineke, inu okwu-Ya.