LUK 20:34-38
LUK 20:34-38 Bible Nso (IGBOB)
Jisus we si ha, Umu nke oge a nālu nwunye, anēnye kwa ha n'ọlulu-di: ma ndi aguru na ha kwesiri iru oge ahu, na iru nbilite-n'ọnwu ahu, bú isi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di: n'ihi na ha apughi kwa inwu ọzọ: n'ihi na ha na ndi-mọ-ozi ra; ha bu kwa umu Chineke, ebe ha bu umu nbilite-n'ọnwu ahu. Ma ọbuná Moses gosiri na anēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, nēkwu nime ebe edere okwu bayere Osisi ntà, mb͕e ọ nākpọ Onye-nwe-ayi Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Ma Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: n'ihi na ọ bu n'ebe Ọ nọ ka madu nile di ndu.
LUK 20:34-38 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha. Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye. Nʼezie, ha apụghịkwa ịnwụ ọzọ, nʼihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke, nʼihi na ha bụ ụmụ nke mbilite nʼọnwụ. Ọ bụladị Mosis nʼonwe ya zipụtara na mbilite nʼọnwụ dị, nʼakụkọ banyere ọhịa ahụ na-ere ọkụ, mgbe ọ na-akpọ Onyenwe anyị ‘Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.’ Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, nʼihi nʼebe ọ nọ mmadụ niile dị ndụ.”