LUK 2:8-11
LUK 2:8-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma e nwere ndị ọzụzụ atụrụ bi nʼọhịa nʼakụkụ ebe ahụ, ndị na-eche igwe atụrụ ha nche nʼabalị. Mmụọ ozi nke Onyenwe anyị pụtara ihe nye ha. Ebube Onyenwe anyị mụwara gburugburu ha, oke egwu tụrụ ha. Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ana m ewetara unu oziọma nke oke ọṅụ nke ga-adịrị mmadụ niile. Nʼihi na taa, nʼobodo Devid ka a mụrụ Onye nzọpụta nye unu; ọ bụ Kraịst, Onyenwe anyị.
LUK 2:8-11 Bible Nso (IGBOB)
Ndi-ọzùzù-aturu di n'otù ala ahu nānọ n'ọhia, nēche kwa ìgwè aturu-ha n'abali. Mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi we guzo ha nso, ebube nke Onye-nwe-ayi muba-kwa-ra ha gburugburu: ha we tua egwu nke-uku. Mọ-ozi ahu we si ha, Unu atula egwu; n'ihi na le, anamezì unu ozi ọma nke oké ọṅù nke gādiri ndi Israel nile: n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi.