LUK 2:34-35
LUK 2:34-35 Bible Nso (IGBOB)
Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide; ma mma-agha gāduwa kwa nkpuru-obi gi onwe-gi; ka ewe kpughe èchìchè nke si n'ọtutu obi puta.
Kesaa
Gụọ LUK 2LUK 2:34-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ. Ọ bụkwa site nʼụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche nke dị ọtụtụ nʼobi. Mma agha ga-adụwakwa mkpụrụobi nke gị onwe gị.”
Kesaa
Gụọ LUK 2