LUK 2:29-34
LUK 2:29-34 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe dị ka i kwere na nkwa, ugbu a zilaga nwaodibo gị nʼudo. Nʼihi na anya m ahụla nzọpụta gị, nke i kwadoro nʼihu mba niile. Ìhè nke ga-egosi ndị mba ọzọ ụzọ, na ebube nke ndị gị Izrel.” O juru nne na nna nwantakịrị ahụ anya ịnụ ihe ndị a e kwuru banyere ya. Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ.
LUK 2:29-34 Bible Nso (IGBOB)
Onye-nwem, ub͕u a ka I gārapu orù-Gi ka ọ la N'udo, dika okwu-Gi si di; N'ihi na anyam ahuwo nzọputa-Gi, Nke I doziri n'iru ndi nile; Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ, Na ebube ndi-Gi, bú Israel. Ihe ekwuru bayere Ya we nēju kwa nna-Ya na nne-Ya anya; Simeon we gọzie ha, si kwa Meri nne-Ya, Le, edowo Nwa nka ka Ọ buru ọdida na nbili nke ọtutu madu n'Israel; ka Ọ buru kwa ihe-iriba-ama anēkwu okwu megide