Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 19:28-44

LUK 19:28-44 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem. Mgbe ọ na-abịaru Betfeji na Betani nso, nʼUgwu a na-akpọ Oliv, Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya, sị, “Gaanụ nʼime obodo nta ahụ dị nʼihu unu. Mgbe unu na-abanye nʼime ya, unu ga-ahụ nwa ịnyịnya e kenyere nʼebe ahụ nke onye ọbụla na-anọkwasịbeghi nʼelu ya, tọpụnụ ya, kpụtara m ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla ajụọ unu, ‘Gịnị mere unu ji atọpụ ya?’ Gwanụ onye ahụ sị, ‘Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.’ ” Ndị ahụ o zipụrụ gara hụ ya dị ka ọ gwara ha. Mgbe ha bidoro ịtọpụ ya, ndị nwe ya jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji atọpụ nwa ịnyịnya ahụ?” Ha sịrị, “Ọ dị Onyenwe anyị mkpa.” Ha kpụtaara Jisọs nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ya, nyere Jisọs aka ka ọ rigoro nʼelu ya. Dị ka ọ na-aga, ndị mmadụ tụsara uwe ha nʼokporoụzọ. Mgbe o rutere nʼụzọ e si arịgo Ugwu Oliv, igwe mmadụ ndị ahụ na-eso ụzọ ya malite iji ọṅụ na-eto Chineke nʼoke olu nʼihi ọrụ ebube niile ha hụrụ, na-asị, “Onye a gọziri agọzi ka eze ahụ bụ nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị.” “Udo nʼeluigwe, ebube dịkwa nʼebe kachasị elu.” Ụfọdụ nʼime ndị Farisii so igwe mmadụ ahụ gwara ya, “Onye ozizi, gwa ndị na-eso ụzọ gị ka ha mechie ọnụ!” Ọ zara sị, “Ka m gwa unu, ọ bụrụ na ha agbaa nkịtị, nkume ndị a ga-eti mkpu.” Mgbe ọ rutere Jerusalem nso, ebe ọ nọ hụzie obodo ahụ anya nke ọma. Ọ bere akwa nʼihi ya, sị, “Ọ bụrụ na ị maara taa, ọ bụladị gị onwe gị, ihe ndị na-eweta udo! Ma ugbu a, ezofuola ha nʼanya gị. Oge na-abịa mgbe ndị iro gị ga-agba gị gburugburu, mechie ụzọ mgbapụ niile, sitekwa nʼụzọ niile dị iche iche bịakwasị gị. Ha ga-egwepịa gị nʼala, gị na ụmụ gị nọ nʼime mgbidi a, ọ dịkwaghị nkume ọbụla ha ga-ahapụ nʼelu ibe ya, nʼihi na ị mataghị oge nleta Chineke nye gị.”

LUK 19:28-44 Bible Nso (IGBOB)

Mb͕e O kwusiri okwu ndia, O we nāga n'iru, nārigoro Jerusalem. O rue, mb͕e Ọ biaruru Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu anākpọ ugwu Olive, na O zigara madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, si, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu; mb͕e unu nābà, unu gāhu nime ya nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasigh: tọpunu ya, sekputa ya. Ọ buru kwa na onye ọ bula ajua unu, si, N'ìhi gini ka unu nātọpu ya? unu gāsi otú a, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà. Ndi ezigara we je, hu dika Ọ gwara ha. Ma mb͕e ha nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu, ndi-nwe-ya we si ha, Gini mere unu nātopu nwa-inyinya-ibu ahu? Ha we si, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà. Ha we sekputa ya nye Jisus: ha we wukwasi uwe-ha na nwa-inyinya-ibu ahu, we tukwasi Jisus na ya. Mb͕e Ọ nāga, ha we tusa uwe-ha n'uzọ. Ma mb͕e Ọ nābiaru Jerusalem nso ub͕u a, n'uzọ nrida nke ugwu Olive, ọra ndi nile nēso uzọ-Ya malitere iṅuri ọṅu na iwere oké olu to Chineke n'ihi ọlu nile di ike nke ha hururi; si, Onye agọziri agọzi ka Eze Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi bu: udo di n'elu-igwe, otuto di kwa n'ebe kachasi ihe nile elu. Ufọdu n'etiti ndi-Farisi we si n'ìgwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, bara ndi nēso uzọ-Gi nba. O we za, si, Asim unu na, ọ buru na ndia ekpuchi ọnu-ha, nkume gēti nkpu. Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá, si, Ọ buru na i mara n'ubọchi a, ọbuná gi onwe-gi, ihe gēweta udo! ma ub͕u a ezonariri ha n'anya-gi. N'ihi na ubọchi gābiakwasi gi, mb͕e ndi-iro-gi gēgwu ékpè na ìgá imegide gi, nọgide kwa gi gburugburu, jigide kwa gi n'akuku nile, tuda kwa gi n'ala, na umu-gi bi nime gi; ha agaghi-arapu kwa nime gi otù nkume n'elu nkume-ibe-ya; n'ihi na i maghi oge nleta-gi.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara