LUK 19:1-28
LUK 19:1-28 Bible Nso (IGBOB)
O we ba na Jeriko nāgabiga kwa n'etiti ya. Ma le, otù nwoke anākpọ aha-ya Zakiọs; onye ahu bu kwa onye-isi-ọna-utu, onye ahu bu kwa ọgaranya. O we chọ uzọ ihu Jisus imata onye Ọ bu; ma ọ pughi n'ihi ìgwè madu, n'ihi na o toghi ogologo. O we b͕a ọsọ ga n'iru, we rigo n'osisi sycomore ka ọ hu Ya anya: n'ihi na Ọ gaje igabiga n'uzọ ahu. Mb͕e Jisus biaruru ebe ahu, O we le anya n'elu, si ya, Zakiọs, me ngwa, ridata; n'ihi na aghaghi m inọdu n'ulo-gi ta. O we me ngwa, ridata, were kwa ọṅù kpọbata Ya. Mb͕e ha huru ya, ha nile we nātamu, si, Ọ bàra inọ ọnọdu-abali n'ulo nwoke bu onye-nmehie. Zakiọs we guzọ, si Onye-nwe-ayi, Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m'nwere ka m'gēnye ndi-ob͕eye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n'ebubo ugha, m'gēnyeghachi anọ anọ. Jisus we si ya, Ta ka nzọputa biaruru ulo a, ebe ya onwe-ya bu kwa nwa Abraham. N'ihi na Nwa nke madu biara ichọ na izọputa ihe nke furu efu. Ma mb͕e ha nānu ihe ndia, Ọ tukwasi tu ilu, n'ihi na Ọ nọ Jerusalem nso, na n'ihi na ha nēchè na ala-eze Chineke gaje iputa ìhè ngwa ngwa. Ya mere Ọ siri, Otù nwoke amazuru aha-ya gara ala di anya, inara ala-eze nye onwe-ya, na ilaghachi. O we kpọ madu iri nime ndi-orù-ya, nye ha ọgu pound abua na iri, si ha, Zuanu ahia rue mb͕e m'gābia. Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n'azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi. O we rue, mb͕e ọ laghachiri ọzọ, mb͕e ọ natasiri ala-eze-ya, na ọ siri ka akpọ ndi-orù ahu, ndi ọ nyereri ego ahu, ka ha biakute ya, ka o we mara ihe ha zutarari n'ahia. Onye mbu we bia n'iru ya, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù ọgu pound abua na iri. Ọ we si ya, I mere nke-ọma, ezi orù: n'ihi na ahuru na i kwesiri ka atukwasi gi obi n'ihe dikarisiri ntà, gi buru onye nāchi obodo iri. Nke-abua we bia, si, Onye-nwe-ayi, pound ise nke gi abawo urù orú pound na ise. O we si kwa nwoke a, Gi onwe-gi buru kwa onye-isi nke obodo ise. Orù nke di iche we bia, si, Onye-nwe-ayi, le pound ise nke gi, nke m'debere n'ákwà: n'ihi na aturum gi egwu, n'ihi na i bu onye aka ike: i nēweli ihe i nātọb͕ọghi, i nēwe kwa ihe n'ebe ikọghi. Ọ si ya, M'gēsite n'ọnu nke gi kpe gi ikpé, ajọ orù. I mara na mu onwem bu onye aka ike, nēweli ihe m'nātọb͕ọghri, nēwe kwa ihe m'nāghaghri; n'ihi gini kwa ka i nējighi were egom nye ndi nāb͕anwe ego, mu onwem gānara kwa ya na uma mb͕e m'biara? O we si ndi guzoro nso, Napunu ya pound ise ahu, were ha nye onye nwere ọgu pound abua na iri ahu. Ha we si ya, Onye-nwe-ayi, o nwere ọgu pound abua na iri. Asim unu, na onye ọ bula nke nwere ka agēnye; ma onye nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum. Mb͕e O kwusiri okwu ndia, O we nāga n'iru, nārigoro Jerusalem.
LUK 19:1-28 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ banyere Jeriko mgbe ọ na-agafe. Otu nwoke nọ ebe ahụ, aha ya bụ Zakịọs; ọ bụ onyeisi ndị ọna ụtụ bụrụkwa ọgaranya. Ọ chọrọ ịhụ onye Jisọs bụ ma ebe ọ bụ onye mkpụmkpụ, ọ dịrịghị ya mfe nʼihi igwe mmadụ. Ya mere, ọ gbaara ọsọ gaa nʼihu rigoro nʼotu osisi sikamọ, ka o nwee ike ịhụ ya dị ka ọ na-agafe nʼụzọ ahụ. Mgbe Jisọs rutere nʼebe ahụ, o lere anya nʼelu sị ya, “Zakịọs, rịdata ngwangwa. Aga m abụ ọbịa nʼụlọ gị taa.” Ọ rịdatara nʼotu mgbe ahụ jirikwa obi ụtọ nabata ya. Mmadụ niile hụrụ nke a, ma bido na-atamu sị, “Ọ gaala ịbụ ọbịa onye mmehie.” Ma Zakịọs biliri ọtọ gwa Onyenwe anyị, “Lee, Onyenwe anyị, aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile m nwere. Ọ bụrụkwa na o nwere onye m ghọgburu nara ya ihe ọbụla, aga m akwụghachi ya okpukpu anọ.” Jisọs gwara ya, “Taa nzọpụta abịala nʼụlọ a, nʼihi na onye a bụkwa nwa Ebraham. Nʼihi na Nwa nke Mmadụ bịara ịchọ na ịzọpụta ndị furu efu.” Dị ka ha na-ege ya ntị nʼokwu a, ọ gara nʼihu tụọrọ ha ilu, nʼihi na ọ nọ Jerusalem nso, ha chekwara na o ruola mgbe alaeze Chineke ga-apụta ihe. Ọ sịrị, “Otu nwoke a mụrụ nʼọnọdụ dị elu gara obodo dị anya ka echie ya eze, ka ọ lọtakwa ma e mesịa. Ya mere, ọ kpọrọ ndị ohu ya iri nye ha mkpụrụ ego iri sị ha, ‘Werenụ ego ndị a zụọ ahịa ruo mgbe m ga-alọta.’ “Ma ndị ọ na-achị kpọrọ ya asị, ha zipụkwara ndị ụkwụ ozi nʼazụ ya na-asị, ‘Anyị achọkwaghị ka onye a chịa anyị.’ “Mgbe ọ natachara ikike ịbụ eze, ọ lọghachiri, kpọọ ndị ohu ya ahụ o nyere ego mgbe ọ na-apụ, ka ha bịa pịaziere ya ego ole ha ritere nʼuru. “Onye nke mbụ bịara sị, ‘Onyenwe m e jiri m mkpụrụ ego ị nyere m rite uru mkpụrụ ego iri ọzọ.’ “Nna ya ukwu sịrị ya, ‘I mere nke ọma, ezi odibo. Nʼihi na i gosiri onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi nʼihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri.’ “Onye nke abụọ bịara sịkwa, ‘Onyenwe m, otu mkpụrụ ego gị amụtala mkpụrụ ego ise ọzọ.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ị ga-achị obodo ise.’ “Onye nke ọzọ bịakwara sị, ‘Onyenwe m, lee mkpụrụ ego gị. Ekechiri m ya nʼakwa, zoo ya. Atụrụ m egwu gị, nʼihi na ị bụ onye afọ tara mmiri, bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ “Ọ sịrị ya, ‘Ọ bụ okwu si gị nʼọnụ ka m ga-eji kpee gị ikpe, gị bụ ohu ọjọọ! I maara na afọ tara m mmiri, matakwa na m na-ewe ihe na-abụghị nke m, na-aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị? Gịnị mere na i wereghị ego m tinye nʼụlọakụ? Nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m ga-anara ya na ọmụrụnwa ya.’ “Mgbe ahụ, ọ gwara ndị guzo nʼebe ahụ, ‘Napụtanụ ya mkpụrụ ego ahụ, were ya nye onye ji mkpụrụ ego iri.’ “Ha sịrị ya, ‘Nna anyị ukwu, o nwelarị mkpụrụ ego iri.’ “Ọ zara, ‘Asị m unu, onye ọbụla nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma onye na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe ahụ o nwere. Ma ndị iro m ahụ, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụpụtanụ ha nʼebe a, gbukwaanụ ha nʼihu m.’ ” Mgbe ọ kwusiri nke a, ọ gakwara nʼihu nʼije ya ịga Jerusalem.