LUK 18:24-30
LUK 18:24-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke. Nʼezie, ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.” Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!” Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.”
LUK 18:24-30 Bible Nso (IGBOB)
Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke! N'ihi na ọ dikariri kamel nfé isite n'anya àgìgá ba nime, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. Ma ndi nuru ya siri, Ònye kwa ka apuru izọputa? Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n'ebe madu nọ apuru ime n'ebe Chineke nọ. Pita we si, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile nke aka ayi, we so Gi. O we si ha, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n'ihi ala-eze Chineke, nke nāgaghi-anata kari ọtutu ihe n'oge a, nata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia.