Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 18:18-43

LUK 18:18-43 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.” Jisọs sịrị ya, “Gịnị mere i ji akpọ m ezi mmadụ? Ọ dịghị onye ọbụla bụ ezi mmadụ ma ọ bụghị naanị Chineke. Ị maara ihe niile enyere nʼiwu, akwala iko, egbula mmadụ, ezula ohi, agbala ama ụgha, sọpụrụ nne na nna gị.” Ọ sịrị, “Edebezuchaala m iwu ndị a niile site na mgbe m bụ nwata.” Mgbe Jisọs nụrụ nke a, ọ sịrị ya, “Otu ihe fọdụrụ ka ime: ree ihe niile i nwere, kesara ụmụ ogbenye ego ya. Ị ga-enwe akụ nʼeluigwe, bịazie soro m.” Mgbe ọ nụrụ nke a, o wutere ya nke ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye nwere ọtụtụ akụ. Jisọs lere ya anya sị, “Lee ka o si bụrụ ihe siri ike bụ ndị ọgaranya ịba nʼalaeze Chineke. Nʼezie, ọ dịrị ịnyịnya kamel mfe isite nʼanya agịga gafee karịa ọgaranya ịbanye nʼalaeze Chineke.” Ndị nụrụ ya sịrị, “Onye kwanụ ka a ga-azọpụta?” Ọ sịrị, “Ihe mmadụ na-apụghị ime, bụ ihe Chineke pụrụ ime.” Mgbe ahụ Pita sịrị, “Lee, anyị ahapụla ihe niile anyị nwere soro gị!” Ọ sịrị ha, “Nʼezie, agwa m unu, o nweghị onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, maọbụ nwunye, maọbụ ụmụnne, maọbụ ndị mụrụ ya, maọbụ ụmụntakịrị ya, nʼihi alaeze Chineke nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.” Jisọs kpọpụrụ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nʼakụkụ, gwa ha sị, “Anyị na-aga Jerusalem, ihe niile ndị amụma dere banyere Nwa nke Mmadụ ga-emezu. A ga-arara ya nyefee ya nʼaka ndị mba ọzọ. Ha ga-akwa ya emo, mee ya ihe ihere, bụkwaa ya ọnụ mmiri asụ. Ha ga-apịa ya ihe, gbukwaa ya; ma nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-esite nʼọnwụ bilie ọzọ.” Ma ha aghọtaghị ihe ọbụla nʼokwu ndị a. E mere ka nkọwa okwu ndị a bụrụ ihe e zoro ezo nʼebe ha nọ, ha aghọtakwaghị ihe o kwuru. O ruo ka ọ bịaruru Jeriko nso, otu nwoke kpuru ìsì nọ nʼakụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ. Mgbe ọ nụrụ uzu igwe mmadụ ka ha na-agafe, ọ jụrụ ihe na-eme. Ha gwara ya, “Jisọs onye Nazaret na-agafe.” O tiri mkpu sị, “Jisọs nwa Devid, meere m ebere!” Ndị bu ụzọ baara ya mba ka o mechie ọnụ. Ma o tisiri mkpu ike sị, “Nwa Devid, meere m ebere!” Jisọs kwụsịrị, nye iwu ka a kpọtara ya nwoke ahụ. Mgbe o rutere nso, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?” Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, ka e mee ka m hụ ụzọ ọzọ.” Jisọs sịrị ya, “Hụ ụzọ, okwukwe gị agwọọla gị.” Ngwangwa, o bidoro ịhụ ụzọ ma soro Jisọs, na-etokwa Chineke. Ndị mmadụ niile, mgbe ha hụrụ ya tokwara Chineke.

LUK 18:18-43 Bible Nso (IGBOB)

Otù onye-isi we jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi? Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke. I matawo ihe nile enyere n'iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi. Ma ọ siri, Ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia. Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som. Ma mb͕e ọ nuru ihe ndia, o wutara ya nke-uku; n'ihi na ọ bu oké ọgaranya. Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke! N'ihi na ọ dikariri kamel nfé isite n'anya àgìgá ba nime, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke. Ma ndi nuru ya siri, Ònye kwa ka apuru izọputa? Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n'ebe madu nọ apuru ime n'ebe Chineke nọ. Pita we si, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile nke aka ayi, we so Gi. O we si ha, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n'ihi ala-eze Chineke, nke nāgaghi-anata kari ọtutu ihe n'oge a, nata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ site n'aka ndi-amuma gēmezu n'ebe Nwa nke madu nọ. N'ihi na agārara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ, me kwa Ya ihe-ọchì, me kwa Ya ihe-ihere, busa kwa Ya ọnu-miri: ha gāpia kwa Ya ihe, b͕ue Ya: n'ubọchi nke-atọ Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie. Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu. O rue, mb͕e Ọ nābiaru Jeriko nso, otù onye-ìsì nānọdu n'akuku uzọ nāriọ aririọ: ma ebe ọ nuru ùzù ìgwè madu ka ha nāgabiga, ọ jua isi ihe a. Ha we kọrọ ya, na Jisus Onye Na-zaret nāgabiga. O we tie nkpu, si, Jisus, Nwa Devid, merem ebere. Ndi bu uzọ ga we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma onye ahu tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere. Jisus we guzo, si ka eduru ya biakute Ya: ma mb͕e ọ biara nso, Ọ jua ya, si, Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Ọ́ si, Onye-nwe-ayi, ka eme ka m'hu uzọ. Jisus we si ya, Ka eme ka i hu uzọ: okwukwe-gi azọputawo gi. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya, nēnye Chineke otuto: ndi-Ju nile, mb͕e ha huru ya, ha we to Chineke.