LUK 18:10-14
LUK 18:10-14 Bible Nso (IGBOB)
Ndikom abua rigoro n'ulo uku Chineke ikpe ekpere; otù nime ha bu onye-Farisi, ibe-ya bu onye-ọna-utu. Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a. Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara. Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n'ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n'obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n'ebe mu, bú onye-nmehie, nọ. Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
LUK 18:10-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ. Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a. Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’ “Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’ “Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”