Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 18:1-14

LUK 18:1-14 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ ọ tụụrụ ha ilu a iji gosi ha mkpa ọ dị ikpe ekpere na-esepụghị aka, ọ sịrị, “O nwere otu ọkaikpe bi nʼotu obodo ma ọ naghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị asọpụkwara mmadụ. Nʼobodo ahụkwa, e nwere otu nwanyị di ya nwụrụ anwụ nke na-abịakwute ya, na-asị ya, ‘Kpepụta m nʼaka ndị na-emegide m.’ “Na mmalite, ọ chọghị, ma nʼikpeazụ, ọ gwara onwe ya sị, ‘Ọ bụ eziokwu na anaghị m atụ egwu Chineke maọbụ sọpụrụ mmadụ. Ma nʼihi na nwanyị a di ya nwụrụ anwụ nọgidere na-enye m nsogbu, aga m ahụ na o nwetara ikpe ziri ezi, ka ọ kwụsị inye m nsogbu site na ọbịbịa ọ na-abịa.’ ” Ya mere Onyenwe anyị sịrị, “Gerenụ ihe ọkaikpe nke na-eme ajọ omume na-ekwu. Ọ bụ na Chineke agaghị ekpepụta ndị ahụ ọ họpụtara, bụ ndị na-akpọku ya ehihie na abalị? Ọ ga-anọ tee anya nʼinyere ha aka? Asị m unu, ọ ga-eme ngwangwa hụ na ha nwetara ikpe ziri ezi. Ma otu ọ dị, mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa, ọ ga-ahụkwa ndị nwere okwukwe nʼime ụwa?” Ọ tụkwara ilu a nʼihi ndị tụkwasịrị obi nʼonwe ha na ha bụ ndị ezi omume ma na-eleda ndị ọzọ anya. “Ụmụ nwoke abụọ rigoro nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere, otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọna ụtụ. Onye Farisii ahụ guzoro ọtọ kpee ekpere banyere onwe ya sị, ‘Chineke nna m, ana m ekele gị nʼihi na adịghị m ka mmadụ ndị ọzọ ndị na-apụnara mmadụ ihe ya nʼike, maọbụ ndị ajọ omume, maọbụ ndị na-akwa iko, ma ọ bụkwanụ dị ka onye ọna ụtụ a. Ana m ebu ọnụ ugboro abụọ nʼizu ụka ọbụla. Ana m akwụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke ihe niile m nwetara.’ “Ma onye ọna ụtụ ahụ guzo nʼebe dị anya, o nwekwaghị ike iweli ihu ya elu lee anya nʼeluigwe. Kama, ọ na-eti aka nʼobi ya na mwute na-asị, ‘Chineke, biko mere m ebere nʼihi na abụ m onye mmehie.’ “Asị m unu, na nwoke a lara nʼụlọ ya bụrụ onye a gụrụ nʼonye ezi omume nʼihu Chineke karịa onye nke ọzọ. Nʼihi na onye ọbụla ga-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda, ma onye ọbụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.”

LUK 18:1-14 Bible Nso (IGBOB)

O we turu ha ilu izí ha na ha aghaghi ikpe ekpere mb͕e nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha; si, Otù onye-ikpé nọ n'otù obodo, onye nādighi-atu egwu Chineke, nke nādighi-asọpuru kwa madu: otù nwanyi nke di-ya nwuru nọ kwa n'obodo ahu; nwanyi ahu we nābiakute ya, nāsi, Kpeputam n'aka onye-irom. Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n'onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu; ma n'ihi na nwanyi a di-ya nwuru nēsobum, m'gēkpeputa ya, ka ọ ghara ime ka ike gwusiam site n'ọbibia ọ nābia mb͕e nile. Onye-nwe-ayi we si, Nurunu ihe onye-ikpé nke nēme ajọ omume kwuru. Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n'ebe ha nọ? Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa? O we tu kwa ilu a nye ufọdu ndi tukwasiri obi n'onwe-ha na ha bu ndi ezi omume, ndi kpọkwara ndi nile fọduru ihe-efu: Ndikom abua rigoro n'ulo uku Chineke ikpe ekpere; otù nime ha bu onye-Farisi, ibe-ya bu onye-ọna-utu. Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a. Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara. Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n'ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n'obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n'ebe mu, bú onye-nmehie, nọ. Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.