LUK 17:11-37
LUK 17:11-37 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n'etiti Sameria na Galili. Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya: ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere. Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha. Ma otù onye n'etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto; o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria. Ma Jisus zara, si, Èmeghi ka aru ndikom iri ahu di ọcha? ma òle ebe iteghete fọduru no? Àhughi ndi laghachiri inye Chineke otuto, ma-ọbughi onye ala ọzọ a? O we si ya, Bilie, ga nke gi: okwukwe-gi azọputawo gi. Ma mb͕e ndi-Farisi juru Ya mb͕e ala-eze Chineke gābia, Ọ zara ha, si, Ala-eze Chineke adighi-abia mb͕e madu nēche nche: ha agaghi-asi kwa, Le, n'ebe a! ma-ọbu, N'ebe ahu! n'ihi na le, ala-eze Chineke di n'etiti unu. O we si ndi nēso uzọ-Ya, Ubọchi gāba, mb͕e agu ihu otù nime ubọchi Nwa nke madu gāgu unu, ma unu agaghi-ahu ya. Ha gāsi kwa unu, Le, n'ebe ahu! Le, n'ebe a! unu ejela, unu esokwala ha: n'ihi na dika àmùmà, mb͕e ọ nēb͕u àmùmà site n'otù akuku n'okpuru elu-igwe, ọ nēnwu rue akuku ọzọ n'okpuru elu-igwe; otú a ka Nwa nke madu gādi n'ubọchi-Ya. Ma Ọ ghaghi ibu uzọ hu ọtutu ahuhu, aghaghi kwa iju Ya site n'ọb͕ọ a. Ma dika emere n'ubọchi Noa, otú a ka ọ gādi kwa n'ubọchi Nwa nke madu. Ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nālu nwunye, anēnye ha n'ọlulu-di, rue ubọchi Noa batara n'ub͕ọ-ya, oké iju-miri ahu we bia, la ha nile n'iyì. Otú ahu dika emere n'ubọchi Lot; ha nēri ihe, ha nāṅu ihe-ọṅuṅu, ha nāzú, ha nēre, ha nāku ihe n'ubi, ha nēwu ulo; ma n'ubọchi Lot siri na Sọdọm puta ọku na brimstone si n'elu-igwe zò, we la ha nile n'iyì: n'otù aka ahu ka ọ gādi n'ubọchi agēkpughe Nwa nke madu. N'ubọchi ahu, onye gānọ n'elu ulo, ma ihe-ya di nime ulo, ya ghara iridata ikwapu ha: otú ahu onye nọ kwa n'ubi, ya ghara ilaghachi. Chetanu nwunye Lot. Onye ọ bula nke gāchọ uzọ izutara onwe-ya ndu-ya, o gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya gēme ya ka ọ di ndu. Asim unu, N'abali ahu madu abua gādi n'elu otù ihe-ndina; agēwere otù nime ha, rapu ibe-ya. Ndinyom abua ganēgwekọ nri n'otù ebe; agēwere otù nime ha, ma agārapu ibe-ya. Madu abua gāno kwa n'ubi; agēwere otù rapu kwa ibe-ya. Ha we za, si Ya, Òle ebe, Onye-nwe-ayi? Ọ si ha, Ebe ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ kwa.
LUK 17:11-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili. Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.” Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha. Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria. Jisọs jụrụ sị, “Ọ bụghị mmadụ iri ka e mere ka ha dị ọcha, ebeekwanụ ka itoolu ndị ọzọ nọ? Ọ bu naanị onye mba ọzọ a lọghachiri inye Chineke otuto?” Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Bilie, laa, okwukwe gị agwọọla gị.” Ma mgbe ndị Farisii jụrụ ya sị, Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa? O kwuru, “Ọbịbịa alaeze Chineke agaghị a bụ nʼụzọ a ga-eji anya efu hụ ya. Ha agaghịkwa asị, ‘Lee, ọ nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘nʼebe ahụ,’ nʼihi nʼezie, alaeze Chineke nọ nʼetiti unu. ” Mgbe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Oge na-abịa mgbe ọ ga-agụsi unu agụụ ike ịhụ otu nʼime ụbọchị nke Nwa nke Mmadụ, ma unu agaghị ahụ ya. Ha ga-asị unu, ‘Lee, nʼebe ahụ,’ maọbụ, ‘Lee, nʼebe a,’ unu agala, unu esokwala ha. Nʼihi na Nwa nke Mmadụ nʼụbọchị ya ga-adị ka amụma nke eluigwe nke na-enye ìhè na mbara eluigwe site nʼotu ebe ruo nʼebe nke ọzọ. Ma ọ ghaghị ibu ụzọ hụọ ọtụtụ ahụhụ, ọgbọ a ga-ajụkwa ya. “Dị ka ọ dị nʼụbọchị Noa, otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị Nwa nke Mmadụ. Ha nọ na-eri na-aṅụ, na-alụ nwunye na-ekekwa ụmụ ha di, ruo mgbe Noa banyere nʼụgbọ mmiri. Oke iju mmiri ahụ bịakwara laa ha nʼiyi. “Otu a ka ọ dịkwa nʼoge Lọt. Ha nọ na-eri, na-aṅụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ. Ma nʼụbọchị ahụ Lọt si nʼobodo Sọdọm pụta, ọkụ na nkume dị ọkụ sitere nʼeluigwe zoo ka mmiri, laa ha niile nʼiyi. “Otu a ka ọ ga-adịkwa nʼụbọchị a ga-eme ka Nwa nke Mmadụ pụta ìhè. Nʼụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ nʼelu ụlọ, ma ihe ya dị nʼime ụlọ, arịtukwala ịba nʼime ụlọ iburu ngwongwo ndị ahụ. Nʼotu aka ahụ, onye ọbụla nọ nʼubi, ya ghara ịlọghachita. Chetakwanụ nwunye Lọt. Onye ọbụla chọrọ iche ndụ ya nche ka ọ ga-efunarị, ma onye ọbụla na-atụfu ndụ ya ga-echebe ya. Asị m unu, nʼanyasị ahụ mmadụ abụọ ga-edina nʼotu akwa, a ga-ewepụ otu nʼime ha hapụ onye nke ọzọ. Ụmụ nwanyị abụọ ga na-akwọ ọka nʼotu ebe, a ga-ewere otu ma hapụ nke ọzọ.” Ụmụ nwoke abụọ ga-anọ nʼubi, a ga-ewere otu onye hapụ nke ọzọ. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebe, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ha, “Ebe ọbụla ozu dị, ka udele na-ezukọta.”