LUK 17:11-16
LUK 17:11-16 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka ọ na-aga Jerusalem, o sitere nʼụzọ dị nʼagbata Sameria na Galili. Mgbe ọ banyere nʼotu obodo nta, ndị ekpenta iri sitere nʼebe dị anya zute ya. Ha tiri mkpu nʼoke olu sị, “Jisọs nna anyị ukwuu, mere anyị ebere.” Mgbe ọ hụrụ ha, ọ sịrị ha, “Gaanụ gosi ndị nchụaja onwe unu.” Dị ka ha na-aga, e mere ka ha dị ọcha. Mgbe otu nʼime ha chọpụtara na a gwọọla ya, ọ laghachiri azụ, jiri oke olu na-eto Chineke. Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, kelee ya. Ọ bụ onye Sameria.
LUK 17:11-16 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e ha nāga Jerusalem, na Ya onwe-ya nāgabiga n'etiti Sameria na Galili. Mb͕e Ọ nābà n'otù obodo ntà, ndikom iri, bú ndi-ekpenta, we zute Ya, ndi guzoro n'ebe di anya: ha we welie olu-ha elu, si, Jisus, Nna-ayi, mere ayi ebere. Mb͕e Ọ huru ha, O we si ha, Ganu, were onwe-unu gosi ndi-nchu-àjà. O we rue, mb͕e ha nāga, na emere ka aru-ha di ọcha. Ma otù onye n'etiti ha, mb͕e ọ huru na emere ka aru di ya ike, ọ laghachi, were oké olu nenye Chineke otuto; o we da kpuchie iru-ya n'ala n'ukwu-Ya, nēkele Ya: onye ahu bu kwa onye Sameria.