LUK 15:3-7
LUK 15:3-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ọ tụrụ ha ilu a sị, “Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu enwee narị atụrụ ma otu nʼime ha akpafuo. Ọ bụ na ọ gaghị ahapụ iri atụrụ itoolu na itoolu ahụ fọdụrụ nʼọzara, pụọ ịchọgharị otu ahụ kpafuru ruo mgbe ọ chọtara ya? Mgbe ọ chọtara ya, ọ ga-eji ọṅụ tụkwasị ya nʼubu ya. Mgbe ọ lọtara nʼụlọ ya, ọ ga-akpọkọta ndị enyi ya na ndị agbataobi ya sị ha, ‘Soronụ m ṅụrịa ọṅụ nʼihi na achọtala m atụrụ m furu efu.’ Asị m unu, nʼụzọ dị otu a, ọṅụ dị ukwu ga-adị nʼeluigwe nʼihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa iri itoolu na itoolu ndị ezi omume bụ ndị nchegharị na-adịghị mkpa.
LUK 15:3-7 Bible Nso (IGBOB)
O we tuara ha ilu a, si, Òle madu di n'etiti unu, nke nwere ọgu aturu ise, ma otù nime ha funariri ya, nke nārapughi ọgu anọ na iri na iteghete ahu n'ọhia, ga so nke furu efu, rue mb͕e ọ gāchọputa ya? Mb͕e ọ chọputaworo ya, we tukwasi ya n'ùbú-ya abua, nāṅuri. Mb͕e ọ biaworo n'ulo, o we kpọkọta ndi-eyì-ya na ndi-ab͕ata-obi-ya, si ha, Sonum ṅuri ọṅu, n'ihi na achọputawom aturum furu efu. Asim unu, na otú a ọṅu gādi n'elu-igwe n'isi otù onye-nmehie nke nēchèghari, kari n'isi ọgu ndi ezi omume anọ na iri na iteghete, ndi nchèghari nādighi nkpà.