Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 15:11-32

LUK 15:11-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O kwukwaara sị, “Otu nwoke mụtara ụmụ nwoke abụọ. Nwa ya nke nta sịrị nna ya, ‘Nna, kenye m oke ruuru m nʼihe niile i nwere.’ Ya mere, o kenyere ya oke nke ya site nʼihe o nwere. “Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, nwokorobịa ahụ kwakọtara ihe niile o nwere gaa biri nʼotu obodo dị anya. Nʼebe ahụ, o mefuchara ihe niile o nwere nʼibi ndụ ọjọọ. Mgbe o mefuchara ihe niile o nwere, oke ụnwụ dara nʼala ahụ. Ọ malitere ịnọ nʼụkọ. Nʼihi nke a, ọ gara binyere otu onye obodo ahụ nyere ya ọrụ ilekọta ezi ya na inye ha nri. Ma ọ na-agụ ya ka o site na nri ọ na-enye ezi rijuo afọ, ma ọ dịghị onye nyere ya ụdị nri ahụ. “Mgbe ọ ghọtara onwe ya, ọ sịrị, ‘Mmadụ ole bụ ndị ọrụ e goro ego nna m nwere, ndị nri na-ezuru ma mapụtakwa, ma agụụ na-egbu m nʼebe a. Aga m ebili lakwuru nna m, sị ya, Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. Ekwesikwaghị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ, were m dị ka otu nʼime ndị i goro ọrụ.’ Ya mere, o biliri laghachikwuru nna ya. “Ma mgbe ọ nọrịị nʼebe dị anya, nna ya hụrụ ya, nwee ọmịiko nʼahụ ya, gbaara ọsọ ga makụọ ya, sutukwa ya ọnụ. “Nwa ya nwoke ahụ sịrị ya, ‘Nna, emehiela m megide eluigwe na gị onwe gị. Ekwesighị m ka a kpọọ m nwa gị ọzọ.’ “Ma nna ya gwara ndị ohu ya sị, ‘Meenụ ngwangwa weta uwe kachasị mma yikwasị ya. Gbanye ya ọlaaka nʼaka, yinyekwanụ ya akpụkpọụkwụ nʼụkwụ. Gaanụ kpụpụta nwa ehi gbara abụba, gbuo ya, ka anyị rie ma ṅụrịakwa. Nʼihi na nwa m a, nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya.’ Ha bidoro na-eri, na-aṅụ na-aṅụrịkwa ọṅụ. “Ọ dịghị anya, nwa ya nke okenye, onye jere ịrụ ọrụ nʼubi, mgbe ọ na-abịaru ụlọ nso, ọ nụrụ ụda egwu na ịgba egwu. Ọ kpọrọ otu nʼime ndị ohu jụọ ya ihe na-eme. Ọ sịrị ya, ‘Nwanne gị nwoke alọtala. Nna gị egbuola nwa ehi gbara abụba nʼihi na ọ lọtara nʼudo na ahụ ike.’ “Iwe were ya, ọ jụrụ ịbata nʼime ụlọ. Nna ya pụtara nʼezi rịọ ya arịrịọ. Ma ọ zara nna ya sị, ‘Lee ọtụtụ afọ niile ndị a ka m nọọ na-ejere gị ozi, enupukwaghị m isi nʼiwu gị nʼụzọ ọbụla. Ma o nweghị oge i nyere m ọ bụladị nwa ewu sị mụ na ndị enyi m jiri ya mee oriri. Ma ugbu a, nwa gị a, onye ya na ndị akwụna mefuru akụ gị alọtala, ya ka i gburu nwa ehi gbara abụba.’ “Ma ọ sịrị ya, ‘Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile m nwere bụkwa nke gị. Ma anyị kwesiri ịṅụrị ọṅụ, kpọọkwa oriri, nʼihi na nwanne gị nwoke a nwụrụ anwụ ma ọ dịla ndụ ọzọ. O fukwara efu ma a chọtala ya. ’ ”

LUK 15:11-32 Bible Nso (IGBOB)

O we si, Otù nwoke ji umu-ndikom abua: nke bu nwata nime ha we si nna-ya, Nna, nyem òkè nke ihe i nwere nke rurum. O we kewara ha ihe nile o ji biri. Mb͕e ọtutu ubọchi agabigaghi nwa-ya nke-nwata ahu we kporo ihe nile, je ala ọzọ di anya; n'ebe ahu ka o mefuru ihe o nwere n'idi ndu nke ila-n'iyì. Ma mb͕e o mefusiri ihe nile, oké unwu siri ike dara n'ala ahu; ya onwe-ya we malite inọ na nkpà. O we ga were onwe-ya rapara n'otù onye nime ndi amuru n'ala ahu; o we ziga ya n'ubi-ya izù ezì. O we nāgu ya iwere mb͕ub͕ọ nke ezì nāta riju afọ-ya: ma ọ dighi onye ọ bula nēnye ya. Ma mb͕e ọ mara onwe-ya ọ si, Ọ̀tutu ndi egoro ọlu ole nke nnam nwebigara ob͕e achicha ókè, ma mu onwem nāla n'iyì n'oké agu n'ebe a! M'gebili jekuru nnam, m'gāsi kwa ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ: mem ka m'di ka otù onye nime ndi nke gi egoro ọlu. O we bilie, biakute nna-ya. Ma mb͕e ọ nọ n'ebe di anya ub͕u a, nna-ya huru ya, o we nwe ọmiko n'aru-ya, b͕a ọsọ, makua ya n'olu, sutu kwa ya ọnu nke-uku. Nwa-ya we si ya, Nna, emehiewom megide elu-igwe, na n'iru gi: ekwesighi m ka akpọkwam nwa-gi ọzọ. Ma nna-ya siri ndi-orù-ya, Chiputa uwe-nwuda nke kachasi nma ọsọsọ, were ya yikwasi ya; tiye kwa nb͕a-aka n'aka-ya, na akpukpọ-ukwu n'ukwu-ya: sekputa kwa nwa-ehi azùru azù, b͕ue ya, ka ayi ri kwa, ka obi tọ kwa ayi utọ: n'ihi na nwam nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fururi efu, ewe hu ya. Ha we malite ime ka obi tọ ha utọ. Ma nwa-ya nke-okenye nọ n'ubi: mb͕e ọ nābia ru ulo nso, o we nu olu abù na ite-egwú. O we kpọ otù onye nime ndi nēje ozi ka ọ biakute ya, we jua ya ihe ha bu, bú ihe ndia. O we si ya, Nwa-nne-gi abiawo; nna-gi eb͕uwo kwa nwa-ehi azùru azù, n'ihi na ọ nara ya n'aru-ike. Ma o were iwe, ọ chọghi kwa ibà n'ulo: nna-ya we puta, riọ ya. Ma ọ zara, si nna-ya, Le, ọtutu arọ ndia ka m'bu orù-gi, ọ dighi kwa mb͕e ọ bula m'rapuru ihe i nyere n'iwu: ma ọ dighi mb͕e ọ bula i nyerem nwa-ewu, ka obi we tọ mu na ndi-eyìm utọ: ma mb͕e nwa-gi nka biara, nke ya na ndinyom ndi nākwa iko ripiara ihe nile i ji biri, i b͕uru nwa-ehi azùru azù nye ya. O we si ya, Nwam, mu na gi nọ mb͕e nile, ihem nile bu kwa nke gi. Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n'ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.