Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 13:1-30

LUK 13:1-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Mgbe ahụ, ụfọdụ ndị nọ nʼebe ahụ gwara ya banyere ndị Galili ahụ Pailet jiri ọbara ha gwakọta nʼaja ha chụrụ. Ọ zara sị ha, “Unu chere na ndị Galili a tara ụdị ahụhụ a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili niile? Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-esi otu ahụ laa nʼiyi. Ka unu chere na mmadụ iri na asatọ ahụ, ndị mgbidi aja ụlọ elu Sailọm dagburu bụ ndị ikpe mmehie mara karịa ndị niile bi na Jerusalem? Mba! Asị m unu, ọ bụrụ na unu echegharịghị, unu niile ga-ala nʼiyi dị ka ha.” Ya mere, ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu nwoke kụrụ osisi fiig nʼubi vaịnị ya, ma mgbe ọ bịara chọọ nʼelu ya, ma ọ hụghị mkpụrụ ọbụla. Ya mere, ọ gwara onye ọrụ ubi ya sị, ‘Nʼime afọ atọ ndị a ka m bịara ka m ghọrọ mkpụrụ site nʼosisi fiig a, ma ahụghị m mkpụrụ ọbụla. Gbutuo ya! Gịnị mere ọ ga-eji na-erikọ nri dị nʼala ubi a?’ “Ọ zara sị ya, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya nʼafọ a, ka m gwuo ala gburugburu, hinye ya aja nri ala nʼukwu. Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ nʼafọ ọzọ, ọ dị mma, ọ bụrụkwa na ọ mịghị, i nwere ike gbutuo ya. ’ ” Nʼụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyere nʼime otu ụlọ ekpere na-ezi ihe. Otu nwanyị nọkwa nʼebe ahụ, onye mmụọ nrịa nrịa mere ka ahụ ghara ị dị ya ike afọ iri na asatọ. Ọ na-ehu ehu, o nwekwaghị ike iguzo ọtọ kwem. Mgbe Jisọs hụrụ ya, ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwanyị emeela ka i nwere onwe gị site nʼọrịa gị.” Mgbe o bikwasịrị ya aka, ngwangwa, o guzooro kwem malite na-eto Chineke. Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nʼihi na Jisọs gwọrọ ọrịa nʼụbọchị izuike. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nʼime izu ụka mgbe mmadụ kwesiri ịrụ ọrụ. Ya mere, bịanụ ka a gwọọ unu nʼụbọchị ndị a, ọ bụghị nʼụbọchị izuike.” Ma Onyenwe anyị zara ya sị, “Unu ndị ihu abụọ! Ọ dị onye nʼime unu na-adịghị atọpụ oke ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, site nʼụlọ anụmanụ, kpụpụ ya ebe ọ ga-aṅụ mmiri nʼụbọchị izuike? O kwesighị ka a tọpụ nwanyị a bụ ada Ebraham nʼagbụ ekwensu kere ya ogologo afọ iri na asatọ, nʼụbọchị izuike, mee ka o nwere onwe ya?” Mgbe o kwuru nke a, ihere mere ndị iro ya niile, ma ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọrụ ebube niile ọ na-arụ. Ya mere, ọ na-ekwu sị, “Gịnị ka alaeze Chineke yiri? Gịnịkwa ka m ga-eji tụnyere ya? O yiri mkpụrụ mọstaadị nke mmadụ kụrụ nʼubi ya a gbara ogige. O toro ghọọ osisi, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.” Ọzọ, ọ sịrị, “Gịnị ka m ga-eji tụnyere alaeze Chineke? Ọ dị ka ihe na-eko achịcha nke nwanyị gwakọtara na ọtụtụ atọ nke ụtụ ọka, tutu ruo mgbe o koro ụtụ ọka ahụ niile.” O jegharịrị nʼobodo ukwu na nʼobodo nta niile na-ezi ihe, ka ọ na-aga Jerusalem. Otu onye sịrị ya, “Onyenwe m, ndị a ga-azọpụta ha ga-adị ole na ole?” Ọ sịrị ha, “Gbalịsienụ ike banye site nʼọnụ ụzọ dị warawara, nʼihi na ana m a gwa unu na ọtụtụ ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike. Ọ bụrụ na nna nwe ụlọ ebilie mechie ọnụ ụzọ, unu ga-eguzo na-ezi na-akụ aka nʼụzọ na-asị, ‘Onyenwe anyị meghere anyị ụzọ.’ “Na nzaghachi, ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu si bịa.’ “Nʼoge ahụ, unu ga-asị, ‘Anyị na gị rikọrọ, ṅụkọkwaa, ị kuzikwara nkuzi nʼogbe anyị.’ “Ma ọ ga-asị, ‘Amaghị m ebe unu siri bịa. Pụọnụ nʼihu m, unu ndị ajọ omume.’ “Ịkwa akwa na ịta ikikere eze ga-adịkwa mgbe unu ga-ahụ Ebraham, na Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ nʼalaeze Chineke; ma unu onwe unu abụrụ ndị a chụpụrụ nʼezi. Ndị mmadụ ga-esite nʼọwụwa anyanwụ, nakwa ọdịda anyanwụ, na nʼugwu na ndịda nke ụwa bịa nọdụ nʼoriri nʼime alaeze Chineke. Ma lee, ndị bu ụzọ ga-aghọ ndị ikpeazụ, ma ndị ikpeazụ ga-aghọ ndị bu ụzọ.”

LUK 13:1-30 Bible Nso (IGBOB)

Ma ufọdu nọ n'ebe ahu n'oge ahu ndi kọrọ Ya akukọ bayere ndi Galili ahu, ndi Pailat were ọbara-ha gwakọta n'àjà-ha. O we za, si ha, Ùnu nēchè na ndi Galili ndia bu ndi-nmehie kari ndi Galili nile, n'ihi na ha ahuwo ahuhu ndia? Asim unu, É-è: kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú ahu. Ma-ọbu madu iri na asatọ ahu, ndi ulo-elu di na Sailoam dakwasiri ha, we b͕ue ha, ùnu nēchè na ndi ahu bu ndi ji ugwọ kari madu nile ndi bi na Jerusalem? Asim unu, É-è; kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú a. O we tua ilu a; Otù onye nwere osisi fig akuru n'ubi-vine-ya; o we bia nāchọ nkpuru n'elu ya, ma ọ hughi. O we si onye-ọlu-vine-ya, Le, site n'arọ atọ rue ub͕u a ka m'nābia nāchọ nkpuru n'osisi fig a, ma ahughm: b͕utue ya; gini mere ọ nēme kwa ka ala la n'iyì? O we za, si ya, Onye-nwe-ayi, rapu kwa ya arọ a, rue mb͕e m'gēgwu ala-ya buruburu, wusa kwa ya ǹsí-anu: ọ buru kwa na ọ mia nkpuru site n'ub͕u a, ọ di nma; ma ọ buru na ọ mighi, i gēb͕utu ya. O we nēzí ihe n'otù nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike. Ma le, otù nwanyi nke nwere mọ nke nēme ka aru-ya ghara idi ike arọ iri na asatọ; o rudakwara ala, ọ pughi kwa iweli onwe-ya elu ma-ọli. Ma mb͕e Jisus huru nwanyi ahu, Ọ kpọ ya, si ya, Nwanyi, emewo gi ka i pua na nriaria-gi. O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto. Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n'ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n'ubọchi-izu-ike. Ma Onye-nwe-ayi zara ya, si, Ndi-iru-abua; onye ọ bula nime unu, ọ̀ dighi-atọpu ehi-ya ma-ọbu inyinya-ibu-ya n'ulo anu-ulo n'ubọchi-izu-ike, duru ya ga ime ka ọ ṅua miri? Ma nwanyi a, ebe ọ bu nwa Abraham, onye Setan kere ab͕u, le, arọ iri na asatọ, ò kwesighi ka atọpu ya n'ab͕ú a n'ubọchi-izu-ike? Mb͕e Ọ nēkwu ihe ndia, ewe me ka ihere me ndi nile nēmegide Ya: ìgwè madu ahu nile nāṅuri kwa ọṅu n'ihi ihe-ebube nile Ọ nēme. Ya mere O kwuru, si, Gini ka ala-eze Chineke yiri? gini ka M'gēji kwa tunyere ya? O yiri nkpuru mustard, nke madu were, tubà n'ubi nke aka ya ab͕ara ogige; o we ba uba, ghọ osisi; anu-ufe nke elu-igwe we nọ n'alaka-ya. Ọzọ kwa Ọ siri, Gini ka M'gēji tuyere ala-eze Chineke? O yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri. O we nāga n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēzí ihe, nāga kwa ije-Ya iru Jerusalem. Otù onye we si Ya, Onye-nwe-ayi, Ǹdi anāzọputa di madu ole-na-ole? O we si ha, Jisienu ike isi n'ọnu-uzọ di warara ba: n'ihi na ọtutu madu, ka M'si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike. Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n'èzí, na iku aka n'ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia; mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Gi, I zíkwara ihe n'amá-ayi; ma Ọ gāsi, Asim unu, amataghm ebe unu si bia; puanu n'irum, ndi nile nālu ọlu ajọ omume. N'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita ikekere-ezé ahu gādi, mb͕e unu gāhu Abraham, na Aisak, na Jekob, na ndi-amuma nile, n'ala-eze Chineke, ma unu onwe-unu aburu ndi achupuru n'èzí. Ha gēsi kwa n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu, si kwa n'Ugwu na Ndida, bia, nọdu kwa n'ala-eze Chineke. Ma le, ndi-ikpe-azu di ndi gēbu uzọ, ndi bu uzọ di kwa ndi gābu ndi-ikpe-azu.