Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 12:13-33

LUK 12:13-33 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị ya, “Onye ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o kenye m oke nʼihe nketa anyị.” Ọ sịrị ya, “Nwoke, onye mere m onye ikpe maọbụ onye ndozi okwu nʼetiti unu?” Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.” Ọ tụụrụ ha ilu a sị, “Otu ọgaranya nwere ala mịrị nnọọ mkpụrụ dị ukwuu. O chere nʼime onwe ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme nʼihi na enweghị m ebe m ga-echekwa mkpụrụ m?’ “Ya mere ọ sịrị, ‘Ihe m ga-eme bụ nke a, aga m akwatu ọba m, wuo nke ka ya ukwuu, bụ ebe m ga-echekwa mkpụrụ m na ihe ndị ọzọ. Ya mere aga m agwa mkpụrụobi m, “I nwere ọtụtụ ezi ihe ga-ezuru gị ọtụtụ afọ, nʼihi ya zuru ike, rie, ṅụọ ma nweekwa obi ụtọ.” ’ “Ma Chineke gwara ya sị, ‘Onye nzuzu, nʼabalị a ka a ga-achọ mkpụrụobi gị nʼaka gị. Ihe niile ị kpakọtara nke onye ka ha ga-abụ?’ “Otu a ka ọ ga-adịrị onye ọbụla na-akpadoro naanị onwe ya akụ, ma ọ baghị ụba nʼebe Chineke nọ.” Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, “Ya mere, asị m unu, unu echegbula onwe unu banyere ndụ unu, ihe unu ga-eri, maọbụ banyere ahụ unu, ihe unu ga-eyi. Nʼihi na ndụ dị mkpa karịa ihe oriri, anụ ahụ dịkwa mkpa karịa uwe. Tuleenụ ugolọma. Ha adịghị akụ maọbụ ghọrọ mkpụrụ ọbụla. Ha enweghị ụlọakụ maọbụ ọba, ma Chineke na-azụ ha nri. Unu ọ dịghị oke ọnụahịa karịa anụ ufe ndị a. Onye nʼime unu pụrụ itinye otu nkeji nʼogologo ụbọchị nke ndụ ya site nʼichegbu onwe ya? Ebe unu na-apụghị ime ihe nta dị otu a, gịnị mere unu ji echegbu onwe unu banyere ihe ndị ọzọ? “Tuleenụ otu okoko ọhịa lili si eto. Ha adịghị arụ ọrụ ọbụla maọbụ tụọ ogho. Ma asị m unu, ọ bụladị Solomọn nʼebube nke ịbụ eze ya niile, eyighị uwe ọbụla mara mma dị ka otu nʼime okoko osisi nke ọhịa ndị a. Ma ọ bụrụ na Chineke si otu a chọọ ahịhịa efu nke ubi mma, nke pụrụ ịdị ndụ taa ma echi atụba ha nʼite ọkụ, ọ bụ na ọ pụghị i si otu a chọọ unu mma karịa? Unu ndị okwukwe nta. Ya mere, unu adọgbula onwe unu maka ihe unu ga-eri maọbụ ihe unu ga-aṅụ. Unu echegbukwala onwe unu. Nʼihi na ọ bụ ihe ndị a ka ndị mba nke ụwa na-achụso, ma Nna unu makwara na ha dị unu mkpa. Kama chọọnụ alaeze ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a niile. “Unu atụla egwu, igwe atụrụ nta, nʼihi na ọ tọrọ Nna unu ụtọ inye unu alaeze ahụ. Reenụ ihe unu nwere nyekwanụ ndị ogbenye. Meerenụ onwe unu akpa na-agaghị aka nka, nʼọba akụ nʼeluigwe, ebe onye ohi na-adịghị abịa nso, nla adịghị erichapụkwa ya.

LUK 12:13-33 Bible Nso (IGBOB)

Ma otù onye sitere n'igwè madu ahu si Ya, Onye-ozizí, gwa nwa-nnem nwoke ka o kère ihe-nketa-ayi nyem. Ma Ọ siri Ya, Nwoke, ònye merem ka M'buru onye-ikpé ma-ọbu onye-òkìkè n'ebe unu nọ? O we si ha, Lezienu anya, debe-kwa-nu onwe-unu ka unu ghara inwe anya-uku ọ bula: n'ihi na ọ bughi n'ihe ọ nwebigara ókè ka ndu madu di, o sighi n'ihe o nwere puta. O we turu ha ilu, si, Ala otù ọgaranya miri nkpuru ri nne: o we tugharia n'obi-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na enweghm ebe ikpokọta nkpurum? O we si, Nka ka m'gēme: m'gēweda ọbam, wu kwa nke ka uku; n'ebe ahu ka m'gēkpokọta ọkam nile na ezi ihem nile. M'gāsi kwa nkpuru-obim, Nkpuru-obi, i nwere ọtutu ezi ihe edebere nye gi rue ọtutu arọ; nēzu ike, nēri ihe, nāṅu ihe-ọṅuṅu, ka obi nātọ gi utọ. Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n'abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n'aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha? Otú a ka ọ di, bú onye nākpadoro onwe-ya àkù, ma ọ bughi ọgaranya n'ebe Chineke nọ. Ọ we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ihi nka ka M'ji si unu, Unu echeb͕ula onwe-unu nye ndu-unu, ihe unu gēri; echeb͕u-kwa-la onwe-unu nye aru-unu, ihe unu gēyi. N'ihi na ndu kariri ihe eji azù ya, aru kari-kwa-ra uwe-oyiyi-ya. Tugharinu uche n'ugolo-ọma, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewe kwa ihe ubi; nke nēnweghi ime-ulo ntà ma-ọbu ọba; ma Chineke nāzù ha: ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku? Ma ònye n'etiti unu puru itukwasi otù cubit n'ogologo-ya site n'icheb͕u onwe-ya? Ya mere ọ buru na unu apughi ime ọbuná nke dikarisiri ntà, gini mere unu nēcheb͕u onwe-unu n'ihe fọduru? Tugharinu uche n'ahihia nke ọhia, otú ha nētó etó: ha adọb͕ughi onwe-ha n'ọlu, ha atughi kwa ogho; ma asim unu, Ọbuná Solomom n'ebube-ya nile, eb͕okwasighi ya ákwà dika otù nime ndia. Ma ọ buru na Chineke eyikwasi ahihia di n'ubi uwe otú a, nke di ta, echi atubà ya n'ite ọku; Ọ̀ gaghi-eyikwasi kari unu uwe nke-uku, unu ndi okwukwe ntà? Unu onwe-unu achọ-kwa-la ihe unu gēri, na ihe unu gāṅu, unu enwe-kwa-la obi abua. N'ihi na ihe ndia nile ka mba nile nke uwa nāchọ: ma Nna-unu nāmata na ihe ndia di unu nkpà. Otú ọ di, chọnu ala-eze-Ya, agātukwasi-kwa-ra unu ihe ndia. Atula egwu, ìgwè aturu ntà; n'ihi na ọ di Nna-unu ezi nma inye unu ala-eze-Ya. Renu ihe unu nwere, were ha lua ọlu ebere; merenu onwe-unu àkpà-ego nke nādighi-aka nká, àkù nādighi-agwu agwu n'elu-igwe, ebe onye-ori nādighi-abia nso, ebe nla nādighi-emebi kwa ihe.