LUK 11:9-13
LUK 11:9-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. “Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ? Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị? Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.”
LUK 11:9-13 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem si kwa unu, Riọnu, agēnye kwa unu, chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu. N'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere. Ma ònye n'etiti unu, bú nna, ka nwa-ya gāriọ ob͕e achicha, ọ nye ya nkume? ma-ọbu azù, ọ nye ya agwọ n'ọnọdu azù? Ma-ọbu asi na ọ gāriọ àkwá ọkuku, ọ̀ gēnye ya akpi? Ya mere, ọ buru na unu onwe-unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu nke elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari Mọ Nsọ nke-uku nye ndi nāriọ Ya?