LUK 11:1-4
LUK 11:1-4 Bible Nso (IGBOB)
O rue, mb͕e Ọ nēkpe ekpere n'otù ebe, mb͕e O kpebìri, na otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Onye-nwe-ayi, zí ayi ikpe ekpere, dika Jọn zikwara ndi nēso uzọ-ya. O we si ha, Mb͕e ọ bula unu nēkpe ekpere, sinu, Nna, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Nēnye ayi nri kwa-ubọchi nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. B͕aghara kwa ayi nmehie nile ayi; n'ihi na ayi onwe-ayi nāb͕aghara kwa onye ọ bula nke ji ayi ugwọ. Ewebà-kwa-la ayi nime ọnwunwa.
LUK 11:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.” Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa. Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị. Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ”