Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 11:1-13

LUK 11:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọ nọ nʼotu ebe na-ekpe ekpere, mgbe o kpesịrị ekpere, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, kuziere anyị ikpe ekpere, dị ka Jọn kuziri ndị na-eso ụzọ ya.” Ọ sịrị ha, “Mgbe unu na-ekpe ekpere, sịnụ: “ ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ ka alaeze gị bịa. Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị. Gbaghara anyị mmehie anyị, nʼihi na anyị na-agbaghara onye ọbụla mehiere megide anyị. Ekwela ka anyị daba nʼime ọnwụnwa.’ ” Ọ sịrị ha, “Onye nʼime unu nwere enyi, ga-agakwuru ya nʼetiti abalị sị ya, ‘Enyi m, biko gbazinye m ogbe achịcha atọ, nʼihi na otu enyi m bịara nʼụlọ m, ma enweghị m nri ọbụla nʼụlọ m nke m ga-enye ya.’ Ma ọ ga-esi nʼime ụlọ zaghachi sị, ‘Enyela m nsogbu, emechiela m ụzọ, mụ na ụmụ m alakpuola, enweghị m ike ibili ugbu a inye gị ihe ọbụla.’ Agwa m unu, ọ bụ ezie na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọbụla nʼihi na ọ bụ enyi ya, kama nʼihi nsogbu ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọbụla dị ya mkpa. “Ya mere, agwa m unu, rịọọnụ, unu ga-arịọta, chọọnụ, unu ga-achọta, kụọkwanụ aka, a ga-emeghekwara unu ụzọ. Nʼihi na onye na-arịọ na-arịọta, onye na-achọ na-achọta, onye na-akụ aka nʼụzọ ka a ga-emeghekwara ụzọ. “Onye nʼime unu bụ nna, ka nwa ya ga-arịọ ya azụ, o nye ya agwọ? Maọbụ rịọọ ya akwa, ọ ga-enye ya akpị? Ọ bụrụ na unu bụ ndị ọjọọ, maara otu esi enye ụmụ unu onyinye dị mma, karịa nke a, Nna unu nke bi nʼeluigwe aghaghị inye ha Mmụọ Nsọ bụ ndị niile na-arịọ ya.”

LUK 11:1-13 Bible Nso (IGBOB)

O rue, mb͕e Ọ nēkpe ekpere n'otù ebe, mb͕e O kpebìri, na otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Onye-nwe-ayi, zí ayi ikpe ekpere, dika Jọn zikwara ndi nēso uzọ-ya. O we si ha, Mb͕e ọ bula unu nēkpe ekpere, sinu, Nna, Ka edo aha-Gi nsọ. Ka ala-eze-Gi bia. Nēnye ayi nri kwa-ubọchi nke gēzuru ayi n'ubọchi ta. B͕aghara kwa ayi nmehie nile ayi; n'ihi na ayi onwe-ayi nāb͕aghara kwa onye ọ bula nke ji ayi ugwọ. Ewebà-kwa-la ayi nime ọnwunwa. O we si ha, Ònye nime unu gēnwe eyì, gējeku kwa ya n'etiti abali, si ya, Eyìm, binyem ob͕e achicha atọ; n'ihi na otù eyìm esiwo n'ije biakutem, ma enweghm ihe ọ bula m'gēdebe n'iru ya; ma onye ahu gēsi nime ulo za, si, Esob͕ulam: emechiwo uzọ ub͕u a, mu na umu-ntakirim nēdina kwa n'ihe-ndina-ayi; apughm ibili inye gi? Asim unu, Ọ buru kwa na ọ gaghi-ebili inye ya n'ihi na ọ bu eyì-ya, ma n'ihi aririọ-ya nēnweghi ihere ọ gēbili nye ya ka ihe di ya nkpà ra. Mu onwem si kwa unu, Riọnu, agēnye kwa unu, chọnu, unu gāchọta kwa; kuanu, agēmeghe-kwa-ra unu. N'ihi na onye ọ bula nke nāriọ nāriọta; onye nāchọ kwa nāchọta; onye nāku kwa ka agēmeghere. Ma ònye n'etiti unu, bú nna, ka nwa-ya gāriọ ob͕e achicha, ọ nye ya nkume? ma-ọbu azù, ọ nye ya agwọ n'ọnọdu azù? Ma-ọbu asi na ọ gāriọ àkwá ọkuku, ọ̀ gēnye ya akpi? Ya mere, ọ buru na unu onwe-unu, ọ bu ezie na unu jọrọ njọ, ma unu nāmata inye umu-unu ezi onyinye, Nnà-unu nke elu-igwe gēsi aṅa ghara iwere kari Mọ Nsọ nke-uku nye ndi nāriọ Ya?

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara