LUK 10:29-37
LUK 10:29-37 Bible Nso (IGBOB)
Ma ebe ọ nāchọ igu onwe-ya n'onye ezi omume, ọ si Jisus, Ònye bu kwa onye-ab͕ata-obim? Jisus zara ya, si, Otù nwoke si na Jerusalem nārida iga Jeriko; o we dabà n'etiti ndi nāpunara madu ihe, ndi b͕ara ya ọtọ ti kwa ya ihe-otiti, we la, rapu ya ọtọgbọrọ. Ma n'otù mb͕e ahu otù onye-nchu-àjà nārida n'uzọ ahu: mb͕e ọ huru ya, o we si n'akuku uzọ ọzọ gabiga. Otú ahu onye Livai, mbe ọ biaruru ebe ahu, hu kwa ya, o we si kwa n'akuku uzọ ọzọ gabiga. Ma otù onye Sameria, mb͕e ọ nọ n'ije, ọ bia rue n'ebe ọ nọ: mb͕e ọ huru ya, o we nwe ọmiko n'aru ya, o we biakute ya, ke ọnyá nile ya, wukwasi ha manu na manya-vine; o we tukwasi ya n'anu-ulo nke aka ya, dubata ya n'ulo ndi-ọbìa, we le ya anya nke-ọma. N'echi-ya o we tuputa shilling abua, nye onye-nwe ulo ndi-ọbìa ahu, si, Le ya anya nke-ọma; ihe ọ bula i n'akuku uzọ kari, mu onwem, mb͕e m'latara, m'gākwughachi gi. Ọ̀ bu onye nime madu atọ a, ka i chère, gosiri onwe-ya ka onye-ab͕ata-obi nke onye ahu dabàra n'etiti ndi ahu nāpunara madu ihe? Ọ si, Onye ahu nke mere ya ebere. Jisus we si ya, Ga, gi onwe-gi me kwa otú ahu.
LUK 10:29-37 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma iji gosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ sịrị Jisọs, “Onye kwanụ bụ onye agbataobi m?” Jisọs sịrị ya, “Otu nwoke sitere Jerusalem na-aga Jeriko, ọ dabara nʼaka ndị ohi, ndị gbara ya ọtọ, tiekwa ya ihe, hapụ ya nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma laa. Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja sitere ụzọ ahụ na-agafe. Mgbe ọ hụrụ ya, o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafee. Otu a kwa, otu onye Livayị bịarutekwara nʼebe ahụ, hụ ya, ma o sitere nʼakụkụ ụzọ nke ọzọ gafeekwa. Ma otu onye Sameria na-aga njem, mgbe ọ bịarutere nso nʼebe ahụ; hụ ya, o nwere ọmịiko nʼahụ ya. Ọ gara nso nʼebe ọ nọ, jiri mmanya na mmanụ wụsa nʼọnya ya, were akwa kechie ya. Ọ tụkwasịrị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buba ya nʼụlọ ndị ije ebe o lekọtara ya anya nke ọma. Nʼechi ya, o wepụtara mkpụrụ ego ọlaọcha abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie ya anya nke ọma. M lọta aga m akwụghachi gị ihe ọbụla ọzọ i mefuru.’ “Onye nʼime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbataobi nye nwoke ahụ nke dabara nʼaka ndị ohi?” Ọ sịrị, “Ọ bụ onye ahụ meere ya ebere.” Jisọs sịrị ya, “Laa, gaa mee otu ahụ.”