LUK 1:67-80
LUK 1:67-80 Bible Nso (IGBOB)
Nna-ya Zakaraias we juputa na Mọ Nsọ, o we bu amuma, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel; N'ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa, O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputa N'ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid (Dika O kwuru site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n'oge mbu), Nzọputa n'aka ndi-iro-ayi, na n'aka ndi nile nākpọ ayi asì; Imere nna-ayi-hà ebere, Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya; Iyí Ọ ṅuru Abraham nna-ayi, Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n'aka ndi-iro-ayi, Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu. N'obi ọcha na ezi omume n'iru Ya ubọchi-ayi nile. Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu: N'ihi na i gāga n'iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile; Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa Nime nb͕aghara nmehie nile ha, N'ihi obi ebere nke Chineke-ayi, Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n'elu gēleta ayi nime ya, Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo. Nwatakiri ahu we nētọ, nēsi kwa ike na mọ-ya, o we nọ n'ọhia rue ubọchi ewere ya gosi Israel.
LUK 1:67-80 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya. O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid. (Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị. O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ. Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa: Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu. Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị. “Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ. Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta site na ịgbaghara mmehie ha. Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe. Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị na nʼonyinyo nke ọnwụ, na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.” Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.