LUK 1:57-64
LUK 1:57-64 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ. Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya, ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.” Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.” Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ. Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya. Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke.
LUK 1:57-64 Bible Nso (IGBOB)
Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke. Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu. O we rue n'ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n'aha nna-ya. Nne-ya we za, si, mba; kama agākpọ ya Jọn. Ha we si ya, Ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-ikwu-gi nke anākpọ aha nka. Ha we fere nna-ya aka, ihe ọ chọrọ ka akpọ ya. O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya. Ngwa ngwa ọnu-ya we saghe, ire-ya tọpu kwa, o we nēkwu okwu, nāgọzi Chineke.