Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

LUK 1:39-80

LUK 1:39-80 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼoge ahụ, Meri biliri gaa ọsịịsọ nʼotu obodo dị nʼugwu Juda. Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼụlọ Zekaraya, kelee Elizabet. Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya nʼafọ megharịrị ahụ. E mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ nsọ. O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ nʼetiti ụmụ nwanyị niile. Onye a gọziri agọzi ka nwa ahụ ị bu nʼafọ bụkwa. Onye kwanụ ka m bụ na ihuọma dị otu a kpọrọ m na nne Onyenwe m ga-abịa ileta m? Ngwangwa m nụrụ olu ekele gị, nwa nọ m nʼafọ wuliri elu nʼọṅụ. Ngọzị ga-adịrị onye ahụ kwere na Onyenwe anyị ga-emezu ihe o kweere ya na nkwa ime.” Ma Meri sịrị, “Mkpụrụobi m na-ebuli Onyenwe anyị elu mmụọ m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke bụ Onye nzọpụta m, nʼihi na o ledatala anya, lekwasị m, bụ odibo ya dị ala. Site ugbu a gaa nʼihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye a gọziri agọzi. Nʼihi na Onye dị ike emeelara m ihe dị ukwuu. Aha ya dịkwa nsọ. Ebere ya na-erute ndị niile na-atụ egwu ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. O gosila ike aka ya; ọ chụsasịala ndị dị mpako nʼime echiche obi ha. O sitela nʼocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nʼobi elu. O jirila ihe dị mma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ ma ndị ọgaranya ka o zipụrụ nʼaka efu. O nyerela odibo ya bụ Izrel aka, ọ na-echetakwa imere ya ebere. Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” Meri nọnyeere ya ihe dịka ọnwa atọ ma mesie laghachi nʼụlọ ya. Mgbe oge zuru ka Elizabet mụọ nwa, ọ mụrụ nwa nwoke. Ndị agbataobi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ebere dị ukwuu, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ. Nʼabalị nke asatọ ha bịara ibi nwata ahụ ugwu na ịgụ ya aha. Ha na-achọ ịgụ ya Zekaraya bụ aha nna ya, ma Nne ya sịrị, “Mba, a ga-agụ ya Jọn.” Ha sịrị ya, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ndị ikwu gị na-aza aha ahụ.” Ya mere, ha jiri ife aka jụọ nna ya, ihe ọ chọrọ ka akpọ nwata ahụ. Ọ rịọrọ ka e nye ya mbadamba ihe e ji ede ihe, o deere “Aha ya bụ Jọn.” Nke a jukwara mmadụ niile anya. Ngwangwa, ọnụ ya meghere, atọpụkwara ire ya. Ya ebido ikwu okwu ma na-etokwa Chineke. Ibubo wụrụ ndị agbataobi ha niile nʼahụ, ndị mmadụ kọkwara akụkọ banyere ihe ndị a niile ruo obodo niile dị nʼakụkụ ugwu Judịa. Ndị niile nụrụ akụkọ a chere nʼobi ha na-ajụ sị, “Gịnịkwa ka nwa nke a gaje ịbụ?” Nʼihi na aka Onyenwe anyị dịnyeere ya. E mere ka Zekaraya bụ nna ya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma sị, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, nʼihi na ọ bịala leta ma gbapụtakwa ndị nke ya. O welielara anyị Onye nzọpụta site nʼụlọ odibo ya bụ Devid. (Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). Na ọ ga-azọpụta anyị site nʼaka ndị iro anyị na sitekwa nʼaka ndị niile kpọrọ anyị asị. O meere ndị nna nna anyị ha ebere site nʼicheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ. Iyi nke ọ ṅụụrụ nna anyị bụ Ebraham, kwekwa nkwa: Na ọ ga-anapụta anyị site nʼaka ndị iro anyị, nyekwa anyị ike ife ya ofufe na-atụghị egwu. Nʼịdị nsọ na ezi omume nʼihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị. “Ma gị nwa m, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye kachasị ihe niile elu; nʼihi na ị ga-aga nʼihu Onyenwe anyị kwadoro ya ụzọ. Ime ka ndị nke ya nwee amamihe nke nzọpụta site na ịgbaghara mmehie ha. Nʼihi oke obi ebere Chineke anyị, nke ọwụwa anyanwụ ga-ewetara anyị site nʼigwe. Ka ọ chakwasị ndị bi nʼọchịchịrị na nʼonyinyo nke ọnwụ, na iduzi ụkwụ anyị nʼụzọ nke udo.” Nwata ahụ toro, bụrụ onye dị ike nʼime mmụọ. O biri nʼime ọzara tutu ruo mgbe oge zuru igosi ụmụ Izrel onwe ya.

LUK 1:39-80 Bible Nso (IGBOB)

Ma Meri biliri na mb͕e ahu, ga elu-ala ọsọsọ, bà n'otù obodo nke Juda; we ba n'ulo Zakaraias, kele kwa Elizabet. O we rue, mb͕e Elizabet nuru ekele Meri, nwa-ya wuliri n'afọ-ya; Elizabet we juputa na Mọ Nsọ; o we welie olu-ya tisie nkpu ike, si, Gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi n'etiti ndinyom, ọ bu kwa onye agọziri agọzi ka nkpuru nke afọ-gi di. Òle ebe ka nka si kwa rum, na nne Onye-nwem gābiakutem? N'ihi na lee, mb͕e olu ekele-gi ruru na ntim, nwam wuliri n'afọm n'obi-utọ. Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n'ọnu Onye-nwe-ayi. Meri we si, Nkpuru-obim nēme ka Onye-nwe-ayi di uku, Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam. N'ihi na O lere ọnọdu di ala nke orù-Ya nwanyi anya: N'ihi na le, site n'ub͕u a ọb͕ọ nile gākpọm onye ngọzi diri. N'ihi na Onye di ike emewom ihe uku di iche iche; Aha-Ya di kwa nsọ. Ebere-Ya di-kwa-ra ndi nātu egwu Ya Rue ọb͕ọ na ọb͕ọ. O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike; Ọ chusawo ndi-npako n'èchìchè nke obi-ha. O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala. O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ; Zipu kwa ndi-ọgaranya n'aka efu. O nyeworo Israel nwa-Ya aka, Ka O we cheta ebere (Dika Ọ gwara nna-ayi-hà) N'ebe Abraham na nkpuru-ya nọ rue mb͕e ebighi-ebi. Meri we nọyere ya ihe dika ọnwa atọ, we laghachi n'ulo-ya. Ma oge Elizabet zuru ka ọ gāmuta nwa; o we mua nwa-nwoke. Ndi-ab͕ata-obi-ya na ndi-ikwu-ya we nu na Onye-nwe-ayi mere ka ebere-Ya di uku n'ebe ọ nọ; ha we so ya ṅuri ọṅu. O we rue n'ubọchi nke-asato, na ha biara ibi nwatakiri ahu úgwù; ha we kpọbá ya Zakaraias, n'aha nna-ya. Nne-ya we za, si, mba; kama agākpọ ya Jọn. Ha we si ya, Ọ dighi onye ọ bula n'etiti ndi-ikwu-gi nke anākpọ aha nka. Ha we fere nna-ya aka, ihe ọ chọrọ ka akpọ ya. O we riọ ha ka ha nye ya ihe eji ede akwukwọ, o we de, si, Aha-ya bu Jọn. O we ju ha nile anya. Ngwa ngwa ọnu-ya we saghe, ire-ya tọpu kwa, o we nēkwu okwu, nāgọzi Chineke. Ndi nile bi ha gburugburu we tua egwu: ewe kwusa okwu ndia nile n'elu-ala Judia dum. Ndi nile nke nuru ha we debe ha n'obi-ha, si, Àha madu gini kwa ka nwatakiri a gābu? N'ihi na aka Onye-nwe-ayi diyere ya. Nna-ya Zakaraias we juputa na Mọ Nsọ, o we bu amuma, si, Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye-nwe-ayi, Chineke nke Israel; N'ihi na O letawo ndi-Ya, lu-kwa-ra ha ọlu nb͕aputa, O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputa N'ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid (Dika O kwuru site n'ọnu ndi-amuma-Ya di nsọ site n'oge mbu), Nzọputa n'aka ndi-iro-ayi, na n'aka ndi nile nākpọ ayi asì; Imere nna-ayi-hà ebere, Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya; Iyí Ọ ṅuru Abraham nna-ayi, Ikweye ayi, ebe adọputaworo ayi n'aka ndi-iro-ayi, Ka ayi nēkpere Ya nātughi egwu. N'obi ọcha na ezi omume n'iru Ya ubọchi-ayi nile. Ọzọ kwa, gi onwe-gi, nwatakiri, agākpọ gi onye-amuma nke Onye kachasi ihe nile elu: N'ihi na i gāga n'iru Onye-nwe-ayi idozi uzọ-Ya nile; Ime ndi nke Ya ka ha mara nzọputa Nime nb͕aghara nmehie nile ha, N'ihi obi ebere nke Chineke-ayi, Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n'elu gēleta ayi nime ya, Imukwasi ndi nọ n'ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; Iduzi ukwu-ayi ba n'uzo udo. Nwatakiri ahu we nētọ, nēsi kwa ike na mọ-ya, o we nọ n'ọhia rue ubọchi ewere ya gosi Israel.